Ntụgharị-Uche Gasị Nke EkeresimesiIhe Atụ
Ụbọchị Ukwu Ahụ Abịaruté
Ka e mesịrị, ememe ọmụmụ bịarà: nwa a mụrụ n'ime ihe eji enye anụ ụlọ nri, nne ya na nna ya, na ndị ọzụzụ-atụrụ. Akụkọ a nwere ike ịbụ nke ana enwekataghị cheta ma ọ bụghị nwa ahụ a mụrụ n'ụbọchị ahụ oké oyi na-atụ.
Ebe ahụ eji enye anụ ụlọ nri dịka ọ bụ akụkụ na-eduga na nnukwu ụlọ ebe ana edebe ụmụ anụmanụ ma n'enye ha nri. A mụghị ọtụtụ ụmụaka n'obí eze ma ọ bụ n'ọnọdụ ịdị ọcha dị mma; ọtụtụ ndị nwụrụ mgbe a mụrụ ha ma ọ bụ mgbe ha ka dị obere.
N'ilaghachị nwa obere ná akụkọ a, Gọvanọ obodo, site n'iwu Siza Ọgọstọs nyere, gwara onye ọ bụla na ndị nwoke dum ga-aga n'obodo ha ka e deba aha ha n'akwụkwọ—dị ka ịgụ ọnụ a n'eme ndị mmadụ, mana ntaramahụhụ gá-esí na ya pụta ga-eju ezigbo anya ma ọ bụrụ na emezughị yabụ iwu.
Nye Josef na Meri oge a abụghị oge dị mma nye ha n'ihi na Meri ga-esi Nazaret gaa Betlehem n'oge ikpeazụ nke afọ ime ya. Njem ahụ rara ezigbo ahụ ma dị ogologo, kilomita iri itoolu. Anyị amaghị ogologo oge ha nọrọ tupu nnukwu ụbọchị ahụ abịa, ma ọ dị ka ọ dịghị nnukwu anya. Ọnụ ọgụgụ ahụ a n'eme pụtara na obodo juru eju na mmadụ, nke mere na ịchọta ebe kwesịrị ekwesị maka ọmụmụ agaghị abụ ihe dị kà o kwesịghị ime, mana ọ ga-abụ ihe nyere ezigbo nsogbu.
Ọtụtụ ihé gbara gburugburu nrubeisi nke Meri nye Chineke jupụtara na nsogbu, n'ikwu ya n'ụzọ dị obere. Anyị agaghị abụ ndị na-egosipụta amamihe ma anyị chee na ime uche Chineke ga-adịrị anyị mfe oge niile, dị anyị ahụ iru ala, ma ọ bụ bụrụ nke n'enweghị mgbagò dịka nnukwu okporo-ụzọ sara mbara. Meri gabigara nkwutọ na ịkwa emo nke ndị obodo, nkewapú n'akụkụ ndị ezinụlọ ya (ugboro atọ, nke anyị maara), na mwute kacha njọ nye nne ọ bụla—ọnwụ nwa,“nnukwu mmà ga-adúpíkwá mkpụrụ obi gị." Mgbe Meri sịrị “ka ọ dịrị m dị ka okwu Gị si dị” ọ ghọtaghị ma ọlị ihe nnakwere ya pụtara, otu ahụ ka ọ dịkwa nye anyị mgbe anyị na-asị ee nye Onye-nwe-anyị. Mana ee bụ naanị nzaghachi anyị pụrụ inye Chineke, n'ihi na ọ bụ ajọ ihe, ihe tụfịakwa, isi Chineke mba. Ee, bụ nzaghachi kacha mma inye Chineke mgbe niile n'ihi na n'agbanyeghị na ọ nwere ike ikpata ihe isi ike, ọ na-ejikwa mmezu miri emi na udo bịa, n'eme gị ka ị mara na ị n'eme Onye-nwe-anyị obi ụtọ. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ime uche Chineke na-edebe anyị n'ọnọdụ dị mma ma n'enye anyị ihe dị mma ọbụna mgbe ndị mmadụ chè na ọ dịghịrí anyị otú ahụ.
Oké ụbọchị ahụ bịarutere, ma Jizọs Kraịst, bụ́ Okwu ahụ bịara n'ụdị mmadụ ka a mụrụ ka Ọ bụrụ nwa n'adịghị ike n’ebe ana-atụghị anya ya n’etiti ndị mmadụ n'ekwesịghị ekwesị. A mughi Ya n'ụlọ eze; ọ dịghị ihe nkwanye-ùgwù gbara Ya gburugburu, Ọ bịaghịkwanu n'oge ebim-ndụ ana elekọta nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nke ọma.
Ndị eze Izrel, ndị isi nchụàjà, na ndị nnọchiteanya Rom anọghị n'ebe a mụrụ Ya, nke ha ji ama na Ọ bịala. Mana o nwere onye hụrụ na ụdị ihe a mere? Ee, ọ dị, mana nke ahụ bụ akụkọ maka ụbọchị ọzọ.
Ụbọchị dị ukwuu, ụbọchị kachasịnụ nye ụwa dum, bịara ma gafee n'emeghị mkpọtụ ọbụla. N'agbanyeghị nke a, ihe magburu onwe ya, ihe mara mma mere n'ụlọ ahụ ebe ana enye anụmanụ nri, ụbọchị ahụ. Nwa-mgbapụta-anyị bịarutere. Chineke bi n'etiti ụmụ mmadụ—Chineke nọnyere anyị—Chineke dị maka anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ Ekeresimesi anyị malitere site n'ozizi Mmụọ Ozi ahụ nyere Meri wee bịa njedebe na nleta ndị Mejai ahụ bịara leta Jizọs. N'ime ntụgharị uche ndị a na ejim-gasị akụkọ nke Ekeresimesi eme ihe, aga m n'ezo aka na Luk, n'ihi na ndekọ ya bụ nke zuru ezigbo okè ná ndekọ ozi ọma.
More