Afọ Ọhụrụ, Otu Chineke AhụIhe Atụ
Òtù Kachasị́ Mma
Obibi ndụ dị ka nke ụlọ akwụkwọ: Onye ọbụla chọrọ ịsonye n'otu ndị uburu ha kachasị enwu ọkụ, kwa ụbọchị anyị ana achọkwa ndị ga-enyere anyị aka ịga nke ọma n'ihe gbasara anyị.
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, enyela m gị nzọụkwụ atọ ị ga-eme iji malite afọ agọziri agọzi, mana e debere m nke kachasị mma ka ọ bụrụ nke ikpeazụ ị ga-amụta.
Ndụ n'aka mma mgbe anyị na ndị dị mma so ebi ya; ibu nke ndụ ewee bụrụ nke n'adịghị anyigbu anyị n'arọ́ ma ụzọ nke ndụ adịghịkwanu esiwanye ike. Ya mere o ji dị mma ka anyị bụrụ ndị sonye n'otù: Ọ bụghị iwu na ị ga-aga ije ụwa naanị gị enweghị onye enyemaka.
Achọrọ m ka ị tụlee ime otu onye m maara akụkụ nke ndụ gị. Ọ bụ enyi n'enwekataghị hapụ gị, Ọ gaghị ekwekwa ka ihe ọjọọ bịa gị nso. IHE NIILE, asị m ihe dum, bụ nke na-adaba nke ọma ma Ọ nọrọ n'akụkụ gị. Ọ na-emeri mgbe niile, ọ dịbeghịkwanu mgbe m hụrụ Ya Ọ dara mbà n'agha. Ọ dị nnọọ obiọma, mgbe ị na-enweghị ihe ma ọ bụ ị nọ na mkpa, ị nwere ike inweta ihe niile i chọrọ n'aka Ya. Ọ gaghị ekwe ka ihe ụwa a tigbuo gị, Ọ ga-anọnyere gị n'ihe niile nke ndụ gị iji kwado gị n'ọrụ gị. Ọ ga-anọnyere gị n'oge ihe isi ike gị ma nyerekwa gị aka ịga n'ihu. Ọ dị ìhè, dị irè. Ọ ga-adọ gị aka ná ntị mgbe ị na-esi n'ụzọ ndụ apụ, ma duo gị ọdụ ka ị chọta ụzọ gị ọzọ. Nke kacha mma bụ na mụ na Ya ekwurịtala okwu maka gị, Ọ dịkwa njikere iso bụrụ onye òtù gị.
Aha Ya bụ Jizọs; Ị maara Ya?
Ka ị na-amalite afọ ọhụrụ a, bu ụzọ rịọ Chineke maka ngọzi Ya na nkwado Ya. Kwe ma nye Ya ohere ka gị na Ya dị njikọ-ọnụ n'ihe niile ga-adapụta n'afọ a. Ka anyị kwụsị ịlụsị Chineke na ihe Ya ọgụ, kwe ka Ọ bata n'ụzọ gị ma nwee ntụkwasị obi na Ọ ga-eduru gị jee ebe ọ dị mkpa ka ị jee, kama ebe anụ-ahụ gị chọrọ ka i gaa.
Iso Chineke n'eje ije bụ ije ije n’udo na nchekwa, n’ihi na Ọ bụ onye ndu anyị.
Afọ nke juputara ná ngọzi na ahụmịhe-gasị cherè anyị; Obi m dị jụụ maka nke a n'ihi na m so na otu onye mmeri. Ihe ịma-aka nke ụwa a ga-apụta chee anyị ihu; ọ bụghị ihe niile ga-adị mma otù anyị siri tụọ, ma ọ bụ n'oge ahụ ka Chineke na-egosi anyị ike na nlekọta Ya.
Cheta: Wụpụtachaa ngwongwo niile dị n'akpatị̀ gị site n'ịhapụ ihe ọjọọ niile ma gaa n'ihu. Tọọ ihe mgbaru ọsọ-gasị ga-enyere gị aka inwe afọ bara uru. N'ahụ onwe gị anya ọma dika otu Chineke si ahu gị; Ị dị ike ime ihe niile. Ncheta ikpeazụ, tinye ndụ gị (afọ a) n'aka Chineke
Chineke + gị = Mmeri ká mmeri.
Ruo oge ọzọ!
Site n'ịhụnanya m, Leslie Ramírez.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Afọ ọhụrụ abịala, ma buru ka ibú, ihe mgbaru-ọsọ ọhụrụ na mkpebi ndị anyị chọrọ imezu. Ihe niile agbanweela n'ụwa; otu o sila dị, anyị nwere Chineke n'adịghị agbanwe-agbanwe pụrụ inye anyị afọ agọziri agọzi. Soro m gụọ ihe ọgụgụ ụbọchị anọ a ga-enyere anyị aka iji ebumnuche dị nzù malite afọ a.
More