Afọ Ọhụrụ, Otu Chineke AhụIhe Atụ
Nwee Nkwenye Siri Ike Maka Onwe-Gị
Ọ dịịrị anyị mfe ịhụ ihe ọma n’ihe niile na n'ime onye ọ bụla. Ka anyị n'ebị ndụ, anyị n'aja mma ma na-eto nkà na ọdịdị nke ndị ọzọ, nke ahụ abụghị ihe ọjọọ. Ma a bịa n’ebe anyị onwe anyị nọ, o yiri ka ọ dịghị mfe ime otú ahụ. Ma ị chọrọ ya ma ọ bụ na ị chọghị, gị na onwe-gị ga-ebikogidé ọnụ ruo mgbe i si n'ụwa a pụọ, ya mere ọ ji dị mkpa ka ị ghara ịna awụ onwe-gị n'ala!
Chineke ji nkà na ike-ọrụ dị iche iche kee onye ọ bụla n’ime anyị, mee anyị n’onyinyo Ya na oyiyi Ya, n'ahụkwa anyị dịka ndị bara nnukwu uru. Ọ na-ahụ ikike niile eji arụ-ọrụ dị mma ị nwere, n'okwu Ya kwa Ọ hapụrụ ọtụtụ ihe ncheta nye gị banyere otú ị si dị mkpa na baa uru, n'ihi na Ọ maara na mgbe ụfọdụ ị nwere ike ichefu ha.
Inwe nkwenye siri ike maka onwe-gị na ịhụ onwe-gị n'anya ka Chineke si kee gị dị ezigbo mkpa. Ihe ole na ole ka ị na-agbalịbeghị ime ma ọlị n'ihi na ị n'eche na ị nweghị ihe ọ na-ewe ime habụ́ ihe? Mgbe ụfọdụ anyị na-atụfu nnukwu ohere bịaara anyị n'ihi na anyị n'eche na anyị enweghị ike ma ọ bụ nkà ime ihe dị na ha. Ọ bụ olileanya m na anyị niile ga-amalite afọ a site na ngọzi, a bụghị nke inwe obi abụọ. Afọ a bụ afọ anyị inwe obi sie ike na anyị pụrụ ime ihe, ọ bụghị nke inwe egwù. Afọ a bụ afọ ịnakwere ihe ịma aka niile n'abịa n'ụzọ anyị n'ihi na "ihe niile Ị chọrọ, bụ́ agụụ nke obi gị, bụ n'akụkụ nke ọzọ ebe egwù dị ka ị ga-ahụ ya." (Jack Canfield).
Nke a bụ ndụmọdụ anọ dị mkpirikpi pụrụ inyere gị aka ịbawanye obi sie ike ị nwere nye onwe-gị:
1. Buru n'uche na ị pụrụ ime ihe ọbụla ị tụkwasịrị obi ime. Ihe niile na-amalite n’ụbụrụ isi gị, ya mere o ji dị mkpa gị inwe uche ziri ezi. Nzọụkwụ mbụ iji mezuo ihe ọbụla ị tụrụ anya ya bụ ikwere na ị pụrụ ime yabụ ihe.
2. Gbaa mbọ hụ na gị na ndị hụrụ gị n'anya na anokó ma na-akparịta ụka. Ndị hụrụ gị ka onye bara uru ná ndụ ha na ahukari ihe ndị mara mma n'ime gị ị na-apụghị ịmata n'onwe gị ma na-echetara gị ka ị si baa uru. Mee ka gị na ndị nkà Chineke jiri gọzie gị dị ha mkpa na ndị hụrụ gị n'anya n'ezie n'anokó (Nna-anyị Chineke, dịka ọmụmaatụ).
3. Chọta otu ihe ị chọrọ nnọọ ime ma ọ bụ nke ị ma anya ya. Ọ dị ezigbo mfe, bụrụ ihe ụtọ ma e kwuwe, anyị iji obi anyị niile gbaa mbọ maka ihe dị anyị mkpa ma ọ bụ ihe anyị hụrụ n'anya n'ezie. Gbaa mbọ hụ na ị chọtara ihe masịrị gị n'ezie, ka uche gị na obi gị ime yabụ ihe na-enwu ka ọkụ.
4. Kwere ihe Chineke na-ekwu banyere gị. Ị dị oke mkpa nke bụ na ọ bụrụ na asị Jizọs nye ndụ Ya ọzọ maka gị, Ọ ga-eme ya. N'ime Akwụkwọ Nsọ enwere ọtụtụ ọmarịcha amaokwu ndị e dere naanị maka gị. Chineke sị na ị bụ onye a hụrụ n'anya, na ị bụ onye siri ike, na ị bara uru nke ukwuu, na ị dị ike ime ihe ọbụla ị tinyere uche gị. Ọ bụrụ na Eze nke kere eluigwe na ala kwere na gị, ọ bụ gịnị kpatazịrị iji ị chọghị inwe ụdị nkwenye a banyere onwe-gị?
Taa ị nwere ike ịhọrọ ịkwụsị inwe obi abụọ banyere onwe-gị. Nke a nwere ike ịbụ afọ mgbe ọ bụla ị na-ele anya n'enyo, gị a n'ahụ onye mara mma na onye zuru oke n'ime Kraịst. Ekwela ka nsogbu ọbụla nke ụwa a na egwù na-achịkwa ndụ gị, Chineke eweregorị̀ ọnọdụ na ndụ gị.
Ihe Omume: Chọpụta ihe atọ banyere onwe-gị ọ na-esiri gị ike ịhụ ha ka ihe mara mma. Nke ị nwere ike ịgbanwe, gbanwee ya; Nke ị na-enweghị ike ịgbanwe, hụ yabụ ihe n'anya.
Leslie Ramírez
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Afọ ọhụrụ abịala, ma buru ka ibú, ihe mgbaru-ọsọ ọhụrụ na mkpebi ndị anyị chọrọ imezu. Ihe niile agbanweela n'ụwa; otu o sila dị, anyị nwere Chineke n'adịghị agbanwe-agbanwe pụrụ inye anyị afọ agọziri agọzi. Soro m gụọ ihe ọgụgụ ụbọchị anọ a ga-enyere anyị aka iji ebumnuche dị nzù malite afọ a.
More