Afọ Ọhụrụ, Otu Chineke AhụIhe Atụ
Ihe dị mma, afọ ọhụrụ abịala ka a tụrụ anya! Enwere m nnukwu agbamume na dị njikere ime ihe n'ime ya.
Nke bụ eziokwu bụ̀ na onye ọ bụla na-amalite afọ n’ụzọ dị iche iche, ya mere m jiri jụọ ụfọdụ ndị enyi m otú ọ na-adị ha ma afọ ọhụrụ bịa, ihe ndị ha na-eme, ma o nwere ihe ndị ha chọrọ ime. Nke a bụ ụfọdụ nzaghachi ha nyere m:
- "Ikwu eziokwu, anaghị m edetụ ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ maka onwe m n'ihi na amaara m na mụ agaghị emezu ha niile, ma ọ na-abụ ihe ụtọ nye m ibi ndụ ruo na ngwụcha afọ enweghị ihe ọjọọ ọbụla mere m."
- “Mgbe ụfọdụ ọ n'enye m obi ụtọ, oge ndị ọzọ anaghị m ele ya anya dịka ihe dị mkpa, ihe niile na-adabere n’otù afọ gara aga si gwụ. Enwere m ihe mgbaru ọsọ m chọrọ imezu, m n'amalite na ihe dị ka asaa. "
- "Ọtụtụ mgbe, ana m echere afọ ọhụrụ n'ụzọ ntụgharị uche, ana m eme onwe m na ndụ m nyocha nke ihe m chọrọ, na otu o si dị m n'oge a."
- "Mgbe m n'amalite afọ, ọ na-adị m ka m nwere ibu ọrụ imezu ihe niile m chọrọ na ịmepụta àgwà ndị ga-enyere m aka imeziwanye onwe m."
- “Echeghị m na m dị mma maka nke a. Afọ ọhụrụ abịala, m ka chọrọ ịna eme ihe ka m si eme ha."
Ị̀ n'ahu onwe-gị n'ime nke ọ bụla n'ime nzaghachi ndị a? Nke ọ bụla n'ime ha nwere otu ihe a ga-eji mara ya: Ha niile setịpụrụ opekata mpe otu ihe mgbaru ọsọ ha chọrọ imezu. Otú ọbụla omume gị si wee dị nye afọ ọhụrụ a, ọ dị mkpa ka ị nwee ihe mgbaru ọsọ gasị iji mee ka afọ a bụrụ ihe bara uru nye gị. Ihe mgbaru ọsọ na-enyere anyị aka iwulite ihe ná mgbakwasị siri ike, n'emepụta ọzụzụ dị mma na akparama-àgwà bara uru. Kedụ ihe ndị gasị ị chọrọ ime? Tọọ ihe mgbaru ọsọ gasị ị maara na ị nwere ike imezu, mana ha bụrụ nke n'ama gị aka imeziwanye onwe gị na ndụ gị karịa ka ịkwadebere.
Ka anyị dị̀ ndụ, anyị ga n'enwe ohere ịgbanwe na imeziwanye ndụ anyị, ya mere were ohere ọbụla pụtaranụ baara onwe gị uru. Otu oge gara aga, otu enyi m gwara m na ya enweghị ihe mgbaru ọsọ ọbụla ya kwadebere maka onwe ya, na ya ga n'ebị ndụ ka ọ dabara. Ị̀ che na o nwere ihe ọbụla bara uru ọ pụrụ irupụta n'afọ ya? Ohere ihe dị otu a ime dị ntakịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla n'eme n'onwe ya, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ime ka ihe dị irè.
Chineke akpọpụtaghị gị n’ụwa a ibi ndụ n'enweghị isi, Ọ chọrọ ịhụ gị ka ị na-eto eto, n'emeziwanye onwe gị ma nweta ihe ndị ị chọrọ. Ebumnuche Ya niile maka gị bụ nke dị ìhè. Ihe mgbaru-ọsọ anyị na ndụ nwere ike ịgbanwe, mana Chineke adịghị mgbe Ọ na-agbanwe, Ọ dị njikere mgbe niile inye anyị ike na inyere anyị aka ime ihe ọ bụla dị n'okpuru uche Ya.
Ihe Omume: Mepụta ndepụta nke ihe mgbaru-ọsọ Iri ịchọrọ imezu n'afọ a, site na nke kachasị mfe ruo na nke ọtụtụ ọrụ dị na ya. Chọpụta àgwà ndị ị kwesịrị ịzụlite iji mezuo ha.
Leslie Ramírez
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Afọ ọhụrụ abịala, ma buru ka ibú, ihe mgbaru-ọsọ ọhụrụ na mkpebi ndị anyị chọrọ imezu. Ihe niile agbanweela n'ụwa; otu o sila dị, anyị nwere Chineke n'adịghị agbanwe-agbanwe pụrụ inye anyị afọ agọziri agọzi. Soro m gụọ ihe ọgụgụ ụbọchị anọ a ga-enyere anyị aka iji ebumnuche dị nzù malite afọ a.
More