Afọ Ọhụrụ, Otu Chineke AhụIhe Atụ
Wụpụtasia Ihe Niile Dị N'akpatì Gị
Ndị nne Latin Amerịka na-azụkarị ihe ncheta iji zigaara ndị ikwu ha niile dịka onyinye mgbe ọ bụla ha gara njem. Ihe kacha atọ ọchị bụ na ha n'ejikwa akpa ha ebufè ihe ahụ niile, n'agbanyeghị ma ohere ọ dị ma ọ dịghị!
Ọ nwetula mgbe ị bụ ụdị onye njem a?
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe na-atọ ọchị ma ị chee echiche banyere ya, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ pụrụ ịbụ ihe n'enye nsogbu mgbe ụfọdụ. Enwere ọtụtụ ihe ị chọrọ inye ndị ọzọ ịgbara mbọ fanyechaa n'ime akpatị̀ gị nke pụtara na ohere adịghịzi n'ime yabụ akpatị̀ maka gị itinye ihe ndị bara uru nye gị.
Otu ihe a na-emekwa na igbe nke ndụ anyị. Anyị dọkpụ akpatị̀ jupụtara n'ihe niile siteré na ahụmịhe anyị gara aga. Anyị bù ọtụtụ ihe n'eme ka akpa anyị dị arọ, ma nke ka njọ, ihe arọ ndị a na-anapụ anyị ohere anyị kwesịrị itinye ihe ga-abara anyị uru.
Gịnị ka anyị ga-ewepụ iji mee ka ohere nọrọ? O nwere ike ịbụ ọnọdụ gara aga nke n'egbochi anyị ịnwale ọzọ. Ma eleghị anya, ya abụrụ obi abụọ kere anyị agbụ ka anyị ghara ịga n'ihu, ikekwe ya abụrụ okwu ọjọọ a gwara anyị, anyị ewee debe ya n'ime obi anyị.
Ọ dị mkpa ịmara na e nweghị iwu dịnụ si na anyị ga-ebù ihe ndị a, ebe ọ bụ na ha abụghị ihe n'eme ndụ anyị mma. Ha kwesịrị ka anyị hapụ ha n'ihe ndị gara aga. Ọ̀ gaghị̀ abụ ezi ihe nye anyị ma anyị hapụ ha ebe ahụ?
Ọ dị mkpa ka anyị wepụta ohere maka ihe ọma niile Chineke chọrọ inye anyị n’afọ a! Ahụmahụ na nkuzi ọhụrụ gasị, ndị mmadụ ọhụrụ Ọ n'eweta n'ụzọ anyị, mmezu ọhụrụ ndị anyị gaje ịnwe ...
Iji nwee afọ a gọziri agọzi, ọ dị mkpa ka anyị wepụta ohere maka yabụ ngọzi. A ma m na ọ na-ara ahụ inwe olileanya ihe kacha mma ma ọ bụrụ na mgbe ọbụla anyị leghachịrị anya azụ anyị echeta ihe ọjọọ niile merenụ, mana cheta na Chineke pụrụ ime ka ihe niile rụọ ọrụ na dị mma n'ụzọ magburu onwe ya. Taa bụ ohere ọhụrụ ibi ndụ dị iche, ibi ndụ site n'okwukwe abụghị site n'egwù, ịnakwere ihe ọma niile Chineke n'eweta n'ụzọ anyị, ịhapụ echiche na ihe ọjọọ niile ahụ anyị pà ka ibu, wee gaa n'ihu.
Ka anyị buru akpatị̀ nke jupụtara na olileanya, ịhụnanya, aṅụrị, udo, ndidi, na ebumnobi mara mma. Ka anyị hapụ ihe ndị ahụ niile bụworo anyị ibu arọ, ma hụ otú Chineke si enyere anyị aka imezu ihe bara uru n’ezie na ndụ anyị. Akwachiela m akpa m maka njem a, gịnị ka ị na-eche?
Ihe Omume: Chee echiche banyere ihe atọ ị bu kemgbe ogologo oge n'enye gị ezigbo nsogbu. Buru ha nye Chineke ma rịọ Ya ka O nyere gị aka ka ha ghara ị ka dị n'akụkụ nke ndụ gị ọbụla.
Leslie Ramírez
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Afọ ọhụrụ abịala, ma buru ka ibú, ihe mgbaru-ọsọ ọhụrụ na mkpebi ndị anyị chọrọ imezu. Ihe niile agbanweela n'ụwa; otu o sila dị, anyị nwere Chineke n'adịghị agbanwe-agbanwe pụrụ inye anyị afọ agọziri agọzi. Soro m gụọ ihe ọgụgụ ụbọchị anọ a ga-enyere anyị aka iji ebumnuche dị nzù malite afọ a.
More