Ido Anya N'Oge Ndị A N'Ejighi Ihe Ọbụla N'AkaIhe Atụ
Enwere ọkụ dị n’ime anyị niile nke na-eche ka amunye ya. Ọkụ na-eto ma nwee ike ịgbasa rụọ ndị gbara gị gburugburu ma ọ bụrụ na ị nọgide n'ikwalite ya bụ ọkụ. Ọkụ a siri ike karịa ejighị n'aka ị nwere ike na-eche. Ọ nwere ikike imeri ihe ọjọọ nke di ka ọ gbara gị gburugburu ugbu a.
Ọkụ ahụ, agụụ ahụ, ike nke ime ahụ ahụ ka Chineke n'onwe Ya kụnyere n'ime gị. Ọchịchọ ime ihe emere gị ka ị mee, ihe ọ bụla nke ahụ nwere ike ịbụ. Ike nke ime ahụ idị ịtachi obi wee pụta n'elu n'agbanyeghị mmegide nọgidere gị.
Enwere m ike amaghị m ihe echi ga-eweta, mana eji m n'aka na m kwesịrị ime ka ihe mee taa.
Enwere m ike amaghị m etu m ga-esi mezụọ ihe ndi bụ ebumnuche m, mana eji m n'aka ihe ndi bụ ebumnuche m.
Amachaghị m OTÚ m ga-esi mee nke ọma, mana EJI M N'AKA na m ga-eme nke ọma.
Amaara m nke a ofuma.
Ekwekọtala m n'ime obi m.
Chineke m enyela m ngwá ọrụ dị mkpa iji hụ na ebumnuche m ga-emezu. Ọ na-eche m nche kemgbe e kere m makwa uche Ya na-emeri mgbe niile.
Amaghị m otú m ga-esi mee ya. Mana obi siri m ike. Amaghị m mgbe m ga-emezu ebumnobi m, mana amaara m na a ga-emezu ha.
Eji m nke a n'aka.
Ihe ọ bụla ị na-agabiga enweghi atụ nye Onye-nwe-anyị. Ihe mgbu ọ bụla, egwu, nkụda mmụọ, ahu ezughi oke, nchekasị, ma ọ bụ ejighị ihe ọbula n'aka ka e mere ka ha bụrụ IHE NDI N'ABỤGHI NSOGBU ỌBỤLA site n'aka Jizọs Kraịst.
N'oge a na-ejighị ihe ọbụla n'aka, atụla egwu. Obi sie gi ike.
Iji jikọọ gi na David Villa, Pịa ebe a!
Iji sonye na Pọdkastị David, Pịa Ebe a!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'etiti ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka, Chineke bụ nke doro anya! Soro David Villa n'ime atụmatụ ọhụrụ ya ka ọ na-elefere ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka na adịghị mma anya iji ruo ihe ka ukwuu.
More