Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ido Anya N'Oge Ndị A N'Ejighi Ihe Ọbụla N'AkaIhe Atụ

Certainty In Times Of Uncertainty

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

N'oge dijitalụ, a na-enye anyị ozi ngwa ngwa karịa ka ọ di na mbu.

Ị nwere ike Google ihe ọ bụla masịrị gị, ma ị nwere ike ịgụ gbasara isiokwu ahụ ruo izu kwa izu. Site na ịpị ihe opipi onyonyo gị, ma ọ bụ irụtụ ya mkpisi aka gị, ị nwere ike ịmụta ihe niile ịchọrọ ịma gbasara ihe ọ bụla. Ọ bụ ezie na nke a kwesịrị ịbụ ihe dị mma nke oge anyị bi na ya, mana ọ dighị otu a mgbe niile. Site n'ụba nke ozi na-abịa n'ụba ozi nke na-ezighi ezi. Akụkọ akpaliri akpali nke ukwuu nke pụtara na anyị enweghịzi ike ịkọ nke bụ eziokwu na nke na-abụghị eziokwu.

Ndị nta akụkọ na ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-achọghị eziokwu dịka mụ na gị emebiela akara dị n'etiti eziokwu na nchepụta nke onwe onye.

Ha na-achọ ọkwa.

Mgbe egwu na-atụ ndị mmadụ, ha ga-agbanye ihe ndi eji egere akụkọ. Ha chọrọ ka a kasie ha obi ma ọ bụ gwa ha ozi gbasara ihe ha na-atụ egwu. Ma, ọtụtụ mgbe ka anyị na-ewere okwu nke mmadụ di ka eziokwu. Anyị na-agụ ma na-ege ntị ma na-eche na ihe ọ bụla e dere ma ọ bụ gwa anyị bu eziokwu, echeghi na isi mmalite nta akụkọ anyị na-enyocha nwekwara ike ịbụ ndị na-ezighị ezi.

NAANỊ EZIOKWU anyị maara bụ na Jizọs Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị. Naanị eziokwu anyị maara ka enyochara, depụta ya, ma nweta ya, bụ na Chineke ga-anọ ya maka mmalite na njedebe. Maka mmepe na mmechi. Ọ bụ Ya bụ onye odide na onye nchịkọta akụkọ, ma okwu Ya bụ ekwusia ogwu. Ọ dịghị ihe aga akpali akpali. Ọ dịghị eziokwu nke Chineke na-ekpughebeghị.

Anaghị m agwa gị ka ị kwụsị ịgụ akụkọ. Ka ịkwụsị ịtụkwasị ndị gbara gị gburugburu obi. Ihe m na-agwa gị bụ na agbanyeghi ihe ọ bụla e dewọrọ, agbanyeghị ihe a kọwọrọ, Chineke a marawọrị ya. Atụmatụ Chineke maka gị adịghị agbanwe n'ihi omume ndi mmadụ. Atụmatụ Chineke adịghị ama jijiji, ọ daberekwaghị n’ihe na-eme gburugburu anyị.

N'oge a na-ejighị ihe ọbula n'aka, Chineke di ndom anya. Atụmatụ anyị nwere ike bụrụ ihe ndi n'enweghi isi ma gbanwee, atụmatụ nke Onye-nwe-anyị dobere maka anyị ga-abụ ihe emezuru emezu.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Certainty In Times Of Uncertainty

N'etiti ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka, Chineke bụ nke doro anya! Soro David Villa n'ime atụmatụ ọhụrụ ya ka ọ na-elefere ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka na adịghị mma anya iji ruo ihe ka ukwuu.

More

Anyi ga-achọ ikele David Villa maka iwete atụmatụ a. Maka ozi ndi ozo, biko gaa na: https://davidvilla.me