Ido Anya N'Oge Ndị A N'Ejighi Ihe Ọbụla N'AkaIhe Atụ
Ọ bụghị mgbe niile ka ihe na-aga dịka atụmatụ anyị siri dị, mana ha ga na-agbaso atụmatụ nke Onye-nwe-anyị mgbe niile.
Ndụ, otú ọ dị, a naghị ebi ya n'enweghị ihe ọ bụla na-eme n'okporo ụzọ. Anyi anaghị ahụ ọdịda n'ime ọnyà ndị di n'ụzọ anyi, anyi na-ahụ ya mgbe anyị kwere ka ọnyà ndị ahu kwụsị anyị na njem anyị. Adịla nnukwu nkụda mmụọ maka ihe ndi n'egbu oge n'uzo gi nke ga-eme ka ị kwụsị ịchụso nzube gị. Anyị enweghị ike ịchịkwa ihe na-eme anyị, ihe anyi nwere ike ịchịkwa bụ nzaghachi anyị nye ihe ahu. Ụkọ chukwu Charles R. Swindoll kwụrụ otu oge na ndụ bụ pasentị iri ihe na-eme gị na pasentị iri itọọlụ ka i si kpasọ ihe ahu àgwà.
Echiche gị bụ ihe dị ike. Ekwenyere m na ndị na-eme nke ọma anaghị eme nke ọma n'ihi na ha nwere nkà karịa ma ọ bụ na ha gbasiri ike n'aka oru. Ndị na-eme nke ọma na-eme nke ọma n'ihi na ha nwere echiche maka ịga nke ọma ọbụna n'oge ọdịda.
Anyị ga-atụkwasịrịrị usoro ahụ obi, ọbụlagọdi mgbe njem ahụ na-ama jijiji. Chineke na-azụlite gị maka atụmatụ nke Ọ kere ka ị bie n'ndụ. Chineke na-etinye anyị n'ime ihe m na-akpọ "oge mgbatị" iji kwadọ anyị n'uche maka ebe anyị na-aga.
Inwe obi ike n’oge a na-ejighị ihe ọbula n’aka apụtaghị ileghara ihe na-eme gburugburu gị anya. Ọ pụtaghị na ị gaghị enwe mmetụta nke egwu, anyị bụ naanị mmadụ. Ọ pụtara na anyị, dịka ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-ahọrọ inwe okwukwe n'etiti egwu na nhụsianya nke nwere ike igba anyị gburugburu. Ọ pụtara na ọbụna egwu di n'uche anyị, anyị maara na Onye-nwe-anyị ga-enye anyị ihe ọ bụla anyị kwesịrị iji na-aga n'ihu.
N'oge a na-ejighị n'aka ihe ọbula n'aka, Akwụkwọ Nsọ gị bụ ihe iji n'aka.
Chineke di ndom anya.
Jizọs ekwekọtawọ n'ime uche Ya.
Ị hụla, anyị nwere ike ibi n’ụwa nwere oke mana anyị na-efe Chineke na-enweghị oke.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'etiti ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka, Chineke bụ nke doro anya! Soro David Villa n'ime atụmatụ ọhụrụ ya ka ọ na-elefere ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka na adịghị mma anya iji ruo ihe ka ukwuu.
More