Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ido Anya N'Oge Ndị A N'Ejighi Ihe Ọbụla N'AkaIhe Atụ

Certainty In Times Of Uncertainty

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Kwa ụbọchị, ndị mmadụ n'ụwa niile na-agbanye igwe onyonyo ha na-ekiri akụkọ.

A na-atụle ihe omume zuru ụwa ọnụ n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n'ime ebe ndi nkiri jụpụtara.

Ihe ọjọọ dị na ịntanetị niile.

Magazin na akwụkwọ akụkọ, ọ bụ ezie na ha anaghị ewu ewu dị ka ha na-adịbu, a ka na-ahụ ha n'ụba.

A ka na-ahụkwa egwu na nhụsianya n'ụba, ka ha dikwa.

Ị nweghị ike ịgbanarị ya. Ọ dị na ihu anyị kwa ụbọchị mgbe niile. Ihe ọjọọ bụ ọrịa n'efe efe jụpụtara ebe niile.

Ma gịnị ka anyị na-eme?

Anyị na-ewelisi olu ihe ndi onyonyo ahu anyi ji ekiri akụkọ.

Anyị na-apị akara njikọ ahụ.

Anyị na-atụgharị gaa na ebe na-esote n'ime akwụkwọ akụkọ gbasara ihe ọjọọ ahu anyi n'agu.

Anyị na-ekwekwa ka ajọ omume ndia anyi n'agu maka ha ma n'ekiri na-abanye n’uche anyị. Anyị na-echegbu onwe anyị maka agha ọ bụla na-aga n'ihu, ọrịa ọhụrụ ọ bụla na-agbasa, ihe ọ bụla ahịa ego na-eme.

Gịnị kpatara anyị ji eme nke a? Kedu ihe na-amasị anyị maka ụdị ozi a?

Egwu na-atụ anyị.

Ọ bụghị ihe nzuzo na e nwere nnukwu ọchịchịrị n'ụwa a, dị njikere ịdọta ndị chọrọ ige ntị n'okpuru ya.

Ma enwekwara nnukwu ọkụ.

Ma, ebe ìhè dị, ọchịchịrị apụghị inwe nmeri.

Ìhè nke na-amụkwasị m mgbe niile n’oge m kasị njọ bụ okwu Chineke. N’ihi na n’agbanyeghị ụdị ọnọdụ ị nọ na ya, Akwụkwọ Nsọ ga-enyere gi aka n'ije gi ka i wee nwee ike imeri ya. Nsogbu gbasara ego, okwu dị n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ mmekọrịta gị, nsogbu n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ọdachi zuru ụwa ọnụ, ha na-acha odo odo ma e jiri ha tụnyere Onye-nwe-anyị, na ruo mgbe ebighị ebi. Akwụkwọ Nsọ gị bụ isi iyi nke ìhè gi na-adịghị agwụ agwụ.

Ọbụna n'ime ụlọ ndị gbara ọchịchịrị, mgbe agbanyere oriọna, ọ na-achụpụ ọchịchịrị ahụ. Ọbụlagodi n’ọgba aghara, n’etiti ọdachi na ejighị ihe ọbula n’aka, ìhè nke Onye-nwe-anyị na-amụkwasị anyị ka na-enwe mmeri. Ọ dịghị ihe ka ukwuu. Ọ dịghị ihe ka egbuke egbuke.

N'ime ọchịchịrị, a na m ahọrọ iru n'ìhè ahụ. Iji kwe ka ọ na-enwusa na mmụọ m na iduga ụzọ iru ụbọchị ndi ka mma.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Certainty In Times Of Uncertainty

N'etiti ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka, Chineke bụ nke doro anya! Soro David Villa n'ime atụmatụ ọhụrụ ya ka ọ na-elefere ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka na adịghị mma anya iji ruo ihe ka ukwuu.

More

Anyi ga-achọ ikele David Villa maka iwete atụmatụ a. Maka ozi ndi ozo, biko gaa na: https://davidvilla.me