Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ido Anya N'Oge Ndị A N'Ejighi Ihe Ọbụla N'AkaIhe Atụ

Certainty In Times Of Uncertainty

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Anyị enweghị ike ijide n'aka mgbe niile ihe ga eme. Agaghị ekwụnwụ ihe ọdịnihu ga-ewetara onye ọbụla. Anyị nwere ike ikwu okwu di ka ndị gụrụ akwụkwọ. Anyị nwere ike iche echiche. Anyị nwere ike ịgbalị ịhụ ụzọ ihe ndi di ka ha meburu n'mbu ma chọpụta ya, ma ọ dịghị onye maara ihe echi ga-eweta. Naanị ihe anyị nwere bụ taa.

Ma taa ezuola.

Ị lanarịrị ụbọchị ọjọọ ọ bụla ruo ugbu a. Ọnọdụ ọ bụla na ndọghachi azụ. E merighị gị. Ị hụla ọnọdụ ndị yiri ihe a na-apụghị imeri emeri na mbụ, ma ị hụwo ndị mmegide na-emenye ụjọ bụ ndị yiri ka ha nwere ihe ha ji kara gi, ma ị pụtawo na mmeri.

N'oge a na-ejighị ihe ọbula n'aka, anyị na-ahọrọ ijide ihe n'aka.

Anyị ji n'aka a bụghị n'ime ihe ndi gbara anyi gburugburu na ọnọdụ anyị kama n'ime Chineke anyị, onye na-enye anyị ihe ndi anyi chọrọ ma na-echebe anyị.

Nji n'aka – Nkwenye siri ike na ihe bụ otu odi. Ogo nke ịbụ ezi ntụkwasị obi. Ihe ama di ka eziokwu bụ eziokwu n'ezie ma ọ bụ ihe omume nke ga-emerịrị.

Ejighị ihe ọbula n'aka – Ọnọdụ nke ejighị ihe ọbula n'aka. Ihe ana-ejighị n'aka ma ọ bụ nke na-eme ka mmadụ nwee mmetụta nke ejighị n'aka.

Ejighị ihe ọbula n'aka na-ekwu si, "Amaghị m ihe ga-eme n'ọdịnihu m.”

Nji n'aka na-ekwu si, "Amaara m onye ji ọdịnihu m!”

Enweghị Kraịst bụ enweghị udo. Ịdị ejighị n'aka. Onye ọ bụla nwere akọnuche n’ime ya, nke ga-adi njum afọ tụpụ onye ahu enwee ezigbo obi ụtọ. Ọ dị naanị otu ihe nwere ike inye akọnuche udo, ma ọ bụ onye ahu na Chineke idi n'ezi mmekorita.

Lụọ ọgụ maka ihe kacha di gị mkpa. Lụọ ọgụ maka okwukwe gị. Lụọ ọgụ maka ezinụlọ gị. Lụọ ọgụ maka ndụ gị. Ekwela ka ihe ndi ọjọọ na ejighị n'aka were ohere n'uche gị. Chineke KA-NỌKWA n'oru nke ngozi.

Oge eruola ka anyị chụpụ ejighị n'aka ma wepụta ụzọ maka nji n'aka. Ihe ọjọọ anọfeela nnabata ya ma ihe di nma na-alọghachi ọzọ!

Ọ di mkpa ka anyị mee ka ụwa di ejighị ihe ọbula n’aka mata otu onye ana-akpọ Jizọs.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Certainty In Times Of Uncertainty

N'etiti ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka, Chineke bụ nke doro anya! Soro David Villa n'ime atụmatụ ọhụrụ ya ka ọ na-elefere ejighị ọnọdụ ọbụla n'aka na adịghị mma anya iji ruo ihe ka ukwuu.

More

Anyi ga-achọ ikele David Villa maka iwete atụmatụ a. Maka ozi ndi ozo, biko gaa na: https://davidvilla.me