Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ

Waiting Here for You, An Advent Journey of Hope

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

Ịdị Umeala N'obi Bụ Ihe Dị Mma Nye Onye Ọbụla

NTỤGHARỊ UCHE

Jizọs bụ Eze nke Ndị Eze, mana Ọ bịakwutere anyị dị ka ohu dị umeala n’obi. Ịdị umeala n'obi abụghị ichè na ị rughị erú, ọ bụ gị ibu eziokwu nke a n'obi na ọ bụ Jizọs mere gị ka iju eju. Ya mere, olee otú i ga-esi eme ka Jizọs? Kedụ ka i ga-esi azụlite mmụọ nke ịdị umeala n'obi?

Ịdị umeala n’obi bụ ihe si na ọnịnọ gị na Jizọs apụta. Onye ọ bụla nke ya na Ya na-eje ije nke ụwa a ná mmekọrịta-chiri-anya agaghị edobe onwe ya elu karịa ka o kwesịrị. Jizọs ịhụ anyị n'anya na anyị ịbata n'ime mmekọrịta nke anyị na Ya, bụ ihe niile dị anyị mkpa iji hazie onwe anyị na iyikwasị onwe anyị ịdị nwaayọ Ya na amara Ya.

Ịdị umeala n'obi apụtaghị na ị gaghị adị ike. Chineke enyewo gị ihe niile dị mkpa ga-eme ka i jiri obi ike bie ndụ dị ka onye nke Ya. Ndị mpako apụghị n'ezie ibuli aha Chineke elu n’otuto. Kama Ọ na-ebuli ndị dị umeala n'obi ruo n'ebe dị elu gasị ọhụrụ.

NTỤGHARỊ NKE IME OBI NA EKPERE

Ekpere Nke-onwe Nke Ịdị Umeala N'obi

Site n'ọchichọ nke kà e too m, napụta m, Jizọs.
Site n'ọchichọ nke kà a n'asọpuru m, napụta m, Jizọs.

Site n'ọchichọ nke kà a na-ahọrọ m karịa onye ọbụla, napụta m, Jizọs.
Site ọchịchọ nke kà a n'ajụ m ihe m cherè, napụta m, Jizọs.
Site n'ọchichọ nke kà ana-asị na m kacha mmadụ niile mma, napụta m, Jizọs.

Site n'ọchichọ nke ịgbara nsogbu ọsọ na ịchọ ndụ nke ntaramahụhụ n'adịghị n'ije m n'ime Chineke, napụta m, Jizọs.
Site n'ụjọ nke kà aghara ikparí m ma ọ bụ wuo m n'ala, napụta m, Jizọs.
Site n'ụjọ nke kà aghara isi na m emetaghị ihe m mere ma ọ bụ ọrụ m rụrụ, napụta m, Jizọs.
Site n'ụjọ nke kà aghara ileghara m anya, napụta m, Jizọs.
Site n'ụjọ nke kà aghara ichefù m, napụta m, Jizọs.
Site n'ụjọ nke kà m ghara ị nọrọ naanị m, napụta m, Jizọs

Site n'egwù nke kà aghara imejọ m, napụta m, Jizọs.
Site n'egwù nke kà m ghara ịta ahụhụ, napụta m, Jizọs.

Ka ahụ ndị ọzọ n'anya karịa mụ onwe m,
Jizọs, nye m amara ka m wee chọọ na nabata nke a.
Ka ewere ndị ọzọ ma si m gaa nọrọ n'ofu akụkụ,
Jizọs, nye m amara ka m wee chọọ na nabata nke a.
Ka e too ndị ọzọ ma hapụ iledi m ma ọ bụ ofu anya,
Jizọs, nye m amara ka m wee chọọ na nabata nke a.

Jizọs, Ị dị nwaayọọ na dị umeala n'obi, mee ka obi m dị ka nke Gị.
Jizọs, Ị dị nwaayọọ na dị umeala n'obi, jiri Mmụọ Gị mee ka m sie ike.
Jizọs, Ị dị nwaayọọ na dị umeala n'obi, kụziere m ụzọ Gị.

Jizọs, Ị dị nwaayọọ na dị umeala n'obi,
nyere m aka ka m wepụ na debe mpako onwe m otu ebe
iji mụta ụdị mmekọ ihe ọnụ mmadụ na ibe ya
n'eme ka ọnịnọ nke ezinụlọ Nna Gị kwe omume. Amen.

E nwetara nke a site n’ekpere Rafael,
Kadịnal Merry Del Val, 1865–1930

Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Waiting Here for You, An Advent Journey of Hope

Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!

More

Anyị ga-achọ ikele Louie Giglio, onye dere N'echere Gị Ebe A (Ụlọ Mbipụta Passion), maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Màkà ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.passionresources.com