N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ
Jizọs Bụ Oriri Nke N'eju Anyị Afọ
NTỤGHARỊ UCHE
Jizọs adịghị naanị enye gị ihe ịchọrọ; Jizọs bụ ihe dị mkpa karịsịa ị chọrọ. E kere obi gị site n'aka Ya, ka O jiri Ya mee ihe masịrị Ya. Ị nwere ike idogbú onwe gị ma lụọ ọgụ iji nweta ihe ụtọ nke ụwa a, mana o bụrụ na i nweghị Jizọs, ị pụghị inwe afọ ojuju nke ndụ ma ọlị.
Ọ bụrụ na e nwere ntakasi na enweghị ezumike n'eto eto n'ime obi gị—agụụ nke ndị mmadụ, ihe ụtọ nke ụwa a, oriri na ọṅụṅụ, ihe onwunwe, ma ọ bụ ugo ndị i turù n'ụwa a akwụsịbeghị—taa bụ ụbọchị imeghe obi gị n'echiché bụ na e kere gị ka ị bie ndụ maka Jizọs. Mana ọ dị mkpa ka ị si na “ihe ndị na-abaghị uru” pụọ, ma rịọ Ya ka ọ bụrụ “afọ ojuju” gị. Jizọs zuru ezù nye gị maka ihe niile, Ọ nọkwa ebe a.
NTỤGHARỊ NKE IME OBI
Bịa, Bịa, Immanuel
Bịa, Bịa, Immanuel,
Bịa gbapụta Ụmụ Izrel adọkpụrụlà n’agha
Bụ ndị n'eru újú nọ naanị ha ebe a
Ruo mgbe Ọkpara Chineke ga-egosi Onwe Ya.
Ṅụrịa nụ! Ṅụrịa nụ!
Immanuel ga-abịakwute unu, Ụmụ Izrel.
Bịa, Alaka-Osisi Nke Jesi,
Bịakwute ndị Gị bịa napụta ha!
Si n'ime ime olulu nke ọkụ mmụọ zọpụta ndị Gị,
Ma nye ha mmeri megide ili.
Ṅụrịa nụ! Ṅụrịa nụ!
Immanuel ga-abịakwute unu, Ụmụ Izrel.
Latịn, c. Narị afọ nke 12
Psalteriolum Cantionum Catholicarum, Köln, 1710
John Mason Neale Sụgharịrị Nke A, 1818–1866, alt.
Stanza 1 & 4
EKPERE
Nna m, naanị Gị maara otú m siri chọsie afọ ojuju ike n’ime ndị mmadụ na n'ime ihe nke ụwa a. Mana ha ezughị okè, mụ onwe m ezughịkwa okè. Naanị Gị pụrụ imeju obi m nke agụụ n'agụ. Naanị Gị nwere ịhụnanya nke na-adịghị ka nke onye ọbụla ọzọ. Ị naghị agbanwe agbanwe. Mepee anya m ụbọchị taa. Gosi m àkù na ebube Gị. Nyere m aka ịmatakwu Gị. Ka m hụ Gị bụ oriri nke akwadoro n'ihu m, ka m wee n'enwere onwe m obi ụtọ n'ime Gị naanị. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!
More