N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ
N'OGE KWESỊRỊ EKWESỊ
NTỤGHARI UCHE
E ekwela ndị Chineke nkwa maka Onye Nzọpụta ruo ọtụtụ narị afọ. Ha chọsiri nke a ike ma kpee ekpere maka nnapụta. Ma ka e mesịrị, n'ụbọchị kwesịrị ekwesị, n'ebe kwesịrị ekwesị, na n'oge kwesịrị ekwesị, a mụrụ Jizọs. Ọ bụ ezie na Chineke anaghị abịa n'oge nkè anyị kara aka, ma Ọ na-abịa mgbe niile n'oge kwesịrị ekwesị.
Ọ nwere ihe nke anyị niile na-echere, ma anyị ana-eche ma Chineke Ọ chefuola anyị. Na nchere gị, ka ọmụmụ Kraịst gbaa gị ume. Naanị n'ihi na ihe ahụ ị na-arịọ Chineke abịabeghị na mmezu (dị ka ị ji anya mmadụ gị na-ahụ), ọ pụtaghị na Ọ gbahapụla gị. N’anya Ya otu ụbọchị dị ka otu puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. Ka ị na-agụ ihe a Ọ na-arụ ọrụ maka ebube Ya na maka ọdịmma gị. Ọ bụ ezie na ọnọdụ gị ugbu a apụtaghị ka ihe anyị n'agwa gị, Chineke ga-emezu ihe ndị ahụ niile Ọ kwere gị nkwa, n'oge Ya Ọ kara aka, imezu atụmatụ Ya niile ndị Ọ họpụtara maka gị oge dị anya. Ike agwụla gị iche Ya tupu oge akara aka eruo.Nweta olileanya site n'akụkọ nke ebe anụ ụlọ n'ehi ụra bụ ebe a mụrụ Kraịst ma mara na a hụrụ gị n'anya na gị bụ onye nke e ji kpọrọ ihe nye Chineke bụ́ Onye siri n’eluigwe rịdata wee bịarute n’oge kwesịrị ekwesị maka gị.
NTỤGHARỊ UCHE
Gee Ntị Nụrụ Ụda Ọṅụ
Gee ntị nụrụ ụda ọṅụ! Onye-nzọpụta na-abịa,
Onye-nzọpụta e kwere nkwa Ya ogologo oge;
Ka obi onye ọbụla kwadooro Ya oche-eze,
Na olu ọbụla dị njikere ịbụrụ Ya abụ.
Ọ n'abịa ịtọhapụ na agbụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ,
N'agbụ nke Ekwensu jigidere ha.
Ụzọ igwe n'etirisi n'ihu Ya ka Ọ n'abịa,
Igwe eji jigidesia aka ná ụkwụ ndị mmadụ na-erubere Ya isi.
Ọ n'abịa ikedo obi gbawara agbawa,
Mkpụrụ obi na-agba ọbara n'iru uju ka Ọ n'abịa ịgwọ,
Na jiri akụ ụba nke amara Ya
mee ka ndị ogbenye dị umeala n’obi bụrụ ọgaranya.
Hozana anyị si n'obi ụtọ, Onye-isi Udo,
Bụ nnabata anyị n'enye Gị ná nkwupụta,
Akụkụ gasị dị ebighị ebi nke Eluigwe ga n'ada ụda
Jiri aha Gi ahụrụ n'oké anya.
Philip Doddridge, 1702–1751
EKPERE
Nna, zutem n’ebe a m na-eme nchere, ebe a m na-agụsi agụụ ike maka ihe na-apụtachabeghị ìhè. Mee ka obi m daa jụụ na nye m ike ịmata na Ị nọ nso. Ekwenyere m na atụmatụ Gị dị mma. Ana m ahụ ya n’ọmụmụ nke Ọkpara Gị naanị.
Ma mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri m ike ịhụ ihe ka m kwesịrị n'ihi anwụrụ ikuku nke gbara m gburugburu. Mee ka ntụkwasị obi m dị ọhụrụ ka m na-eweli anya m elu elekwasị Gị anya. Ka otuto dịrị Gị na ndụ m n'oge a m n'enwe atụmanya. Amen.Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!
More