N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ
NỌRỌ JỤỤ
Oge ịnọ jụụ ka anyị n'echeré Chineke n'ime olileanya
NTỤGHARỊ UCHE
Oge nkwagharị na mkpọtụ n'adịghị abụghị ihe a n'ahụ mgbe niile ma o nwere ike isi ike ịnweta ịdị jụụ, mana were nkeji ole na ole n'ime ụbọchị taa jiri jụụ na ntụgharị uche dị ime chee echiche banyere Onye-nwe-anyị. Agụla ihe ọbụla ma ọ bụ mụọ ihe ọbụla ma ọ bụ kwe ka uche gị pụọ n'ihe a—naanị nọrọ jụụ wee n'atụgharị uche n'Onye Jizọs Kraịst bụ̀ na ihe niile O meworo gị. Chee echiche banyere ọmụmụ Ya, oge Ọ dị ka nwa a mụrụ ọhụrụ, na ìhè nke chi-ọbụbọ n'ebili wee n'acha n'elu ụwa gbara ọchịchịrị na nke ike gwụrụ. Chee echiche banyere ọnwụ Ya na àjà O ji Onwe Ya chụọ, na onyinye nke ndụ Ọ n'esetí aka wee n'enye gị. Tugharia uche na nbilite n'onwu Ya, ike Ya n'elu ọchịchịrị na ili. Ṅụọ ọnịnọ Ya ka mmiri na chọọ ihu Ya n'ime ịdị jụụ gị. Cheekwa echiche banyere ọbịbịa Ya, ụbọchị ị ga-ahụ Ya ihu na ihu.
NTỤGHARỊ NKE IME OBI
Were nwa oge wee dị nnọọ jụụ n'ihu Ya. Chee echiche banyere Jizọs, tụkwasị kwa Ya obi.
EKPERE
Nna m, anọ m ebe a n'echere Gị. Bịa zute m n'ime ịdị jụụ mụ a. Bịa zute m n'ime oge a. Bịa zute m n'ime na site n'Okpara Gị na site na Mmụọ Gị. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!
More