N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ
CHINEKE NA-ARỤ ỌRỤ KA ANYỊ N'EME NCHERÉ
NTỤGHARỊ UCHE
Ọ bụrụ na anyị ga-ekwu eziokwu, o nweghị otu n'ime anyị nke ime nchere n'amasị. N'ezie, ọtụtụ mgbe ka anyị na-ekwu ihe dị ka, "Enweghị m ike ikwere na nke a na-ewe ogologo oge; ọ na-efu m oge m n'enweghị! " Nke ahụ bụ n'ihi na ọtụtụ n'ime anyị na-echè na ime nchere bụ ihe efu. Ma ọ bụghị otu ahụ ka ọ dị n’ebe Chineke anyị nọ.
Chineke na-arụ ọrụ ka anyị na-eme ncheré. Ọbụna mgbe ị n'enweghị ike ịhụ ihe Ọ na-eme, Chineke na-ahazi ihe omume nke eluigwe na ụwa mgbe niile iji mezuo nzube Ya maka ndụ gị. Tụkwasị obi n’ịhụnanya Ya nke na-adịghị ada ada—ịhụnanya nke kpaliri Ya izite Onye-nzọpụta si n’elu-igwe bịa iweghachi na ịnapụta gị. Atụmatụ Chineke maka ndụ gị abụghị nke a pụrụ imebi. Were ndidi n'eme ncheré, ebe ị maara na ime ncheré na Chineke agaghị abụ ihe efu.
NTỤGHARỊ NKE IME OBI
Bịa Jizọs A Tụrụ Anya Ya Ogologo Oge
Bịa, Jizọs a tụrụ anya Ya ogologo oge
A mụrụ ime ka ndị Gị nwere onwe ha;
Sì n'egwù na nmehie anyị napụta anyị,
Ka anyị nweta izu-ike n'ime Gị
Ike na Nkasi Obi Izrel,
Olileanya ụwa nile ka Ị bụ;
Ọdịnobi nke mba niile,
Ọnụ nke obi niile agụụ n'agụ.
A mụrụ ịnapụta ndị Gị,
A mụrụ ka nwa mana Ị bụ Eze,
A mụrụ ịchị n'ime anyị ruo mgbe ebighị ebi,
Ugbu a weta alaeze Gị jupụtara n'amara.
Site na Mmụọ Gị dị ebighị ebi
Chịa n'ime obi anyị niile naanị Gị;
Site n'ike aka Gị zuru oke,
Welie anyị elu ka anyị rute ocheeze Gị dị ebube.
Charles Wesley, 1707–1788
EKPERE
Nna m, anọ m ebe a n'echere Gị. Obi m na aka m ghere oghe maka ebumnuche Gị na atụmatụ Gị niile maka ndụ m. Nye m ndidi nke dị m mkpa nke ukwuu ma duo m n'ime ncheré m. Ọ bụ ezie na mmetụta-uche m erutebeghị ebe ahụ, mana ekwenyere m na Ị n'arụ ọrụ ugbu a maka m, ọbụna ka m n'agụ ihe a, n'echebe m, n'agbachitere m, n'akwadebe m, n'enye m ihe. Nye m amara ka m wee na-atụkwasị Gị obi n'ihu oke ifufè nke obi abụọ n'efegharị gburugburu m. Kwunye obi m chịm n'ime Gị. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!
More