N'echeré Gị Ebe A, Njem Olileanya Nke Amụma Ọkwa ỌbịbịaIhe Atụ
EBUBE N'ELU KASỊ ELU
NTỤGHARỊ UCHE
Chineke enweghị onye ha ka Ya. Ọ dịghịkwanu onye Ya na ya n'atụ aka. O nweghị ụkọ. O nweghị mkpa. Ọ nọ tupu ihe niile adị na mgbe ihe niile gabigachara ọ bụkwa naanị Ya kà ga-adị. Ụwa juputara na chi “obere c” mana Chineke anyị kerè eluigwe na ụwa. Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere Ya. Ma ọlị.
Ya mere ka ị nọ n'echere Ya ụbọchị taa, nye Ya otuto. Eleghị anya ọnọdụ gị dị ka ọ tụgharịrị isi kpudo ihu n'ala, mana ocheeze Ya dị ebe dị ukwuu dị mma, ebe i ga-esi nweta ngwọta niile ị chọrọ! Too Ya ka ị nọ n'eme ncheré. Bulie Ya elu ka ị n'eme ntụgharị uche. Ya mere, arịọlá Ya ọtụtụ ihe taa, naanị n'ebuli Aha Ya elu karịa aha niile. Ka Aha ahụ wetuo obi gị ala, na mee ka mkpụrụ obi gị daa jụụ. Ka otuto gị mechie ọnụ ihe niile na-alụ ọgụ inata isi-ala gị na ịhụnanya gị. Mgbe ị mere nke a, abụ gị nke si gị n'obi ga-ebugo echiche gị n'elu ebe kasị elu.
NTỤGHARỊ NKE IME OBI
Ebube N'Elu Kasị Elu
Ị bụ Onye Mbụ
Ị na-aga n’ihu
Ị bụ Onye Ikpeazụ
Onye-nwe-anyị, Ọ Gị bụ Onye a n'achọ ihe Ya mgbe niile
Aha Gị dị n’ìhè kà mmadụ niile hụ
Kpakpando nke eluigwe na-ekwupụta ebube Gị
Ebube n'elu kasị elu
Ebube n'elu kasị elu
Ebube n'elu kasị elu
Enweghị chi dị, ebe Ị bụ Chi
Ìhè nke ụwa niile
Kpakpando Ututu N'egbuke Egbuke
Aha Gị ga-eti kà anyanwụ ka ụwa niile hụ
Ị bụ Onye M bù n'obi
Ị bụ ebube m
Ọ dịghịkwanu onye a ga-eji
atụnyere Gị Onye-nwe-anyị
Ụwa nile ji otu olu n'ekwu . . .
Ebube n'elu kasị elu . . . dịrị Gị, Onye-nwe-anyị
Ụwa nile ga-abụ abụ otuto Gị
Ọnwa na kpakpando, anyanwụ na mmiri ozuzo
Mba niile ga-eji olu ike tie
Na Ị bụ Chineke na ọ bụ Gị ga-achị
Ebube, ebube halleluya
Ebube, ebube dịrị Gị, Onye-nwe-anyị
Ebube, ebube halleluya
Halleluya
Chris Tomlin, Matt Redman, Jesse Reeves, Daniel Carson, Ed Cash
EKPERE
Chineke m, gịnị ka m ga-agwa Gị? Ị nweghị onye ma ọ bụ ihe Gị na ya ha, ma ọ bụ onye Gị na ya na-atụ aka. Okwu m na echiche m niile dị ntakịrị ma e jiri ha tụnyere Gị. Ahụla m abalị jupụtará na kpakpando mana ọ pụghị ma ọlị iji wee tụnyere ebube Gị. Mee ka okwukwe m bawanye ma nye m okwu m ga-ekwu ka m n'akwado iso ịbụ abụ otuto n'enye Gị.
Otuto niile bụ nke Gị, ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. Aga m eje ije n'eziokwu ahụ ụbọchị taa. Aga m ekwere ya. Mee ihe n'ime ya. Buru ya uche ka m n'ekpe ekpere. Nye ihe site na nduzi ya. N'enye otuto dị ka ọ dịghị onye dị ka Gị. Amen!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Amụma Ọkwa Ọbịbịa n'ikọwa ya n'ụzọ dị mfe bụ̀ oge ncheré na nkwadó. Soro pastọ na onye odee akwụkwọ Louie Giglio na njem nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa iji chọpụta na ncheré abụghị ime ihe efu mgbe ị na-eche Onye-nwe-anyị. Jidesie ohere a dịnụ ike iji kpughee oké olileanya e nyere site na njem Amụma Ọkwa Ọbịbịa. N'ime ụbọchị asaa n'esotenụ ị ga-enweta udo na agbamume maka mkpụrụ obi gị n'ihi na atụmanya ga-eduga gị n'ememe nke ọṅụ!
More