Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!Ihe Atụ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

“Bụrụ Onye Àmà Dị Irè”

Ịmara otú e si abụ onye àmà dị irè n’ụwa anyị kwa ụbọchị na-amalite site n’ịghọta ihe Chineke chọrọ ka ndị ọzọ na-ahụ ná ndụ anyị. Azịza kacha nta n'ezie bụ, Jizọs. Ma gịnị ka nke ahụ pụtara?

Jizọs rọpụtara ihe atụ zuru okè nke otú Chineke chọrọ ka anyị si bie ndụ. Ọ bụ ezie na otu Jizọs siri bie ndụ ya n’ụwa dị nnọọ iche na nke anyị taa, O chịkọtara àgwà zuru oke nke Chineke ma nye ihe atụ dabara adaba maka ụwa nke oge a.

Ọ bụ àgwà Chineke ka ọ chọrọ ịzụlite na ndụ anyị na ka ndị ọzọ na-ahụ ya. A na-enweta nke a naanị site na mmekọrịta nke anyị na Jizọs. Jizọs kwuru, sị:

“Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya.” Jọn 15:5

“Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm.” Jọn 15:8

Dị nnọọ ka alaka nke na-anọgide n'ime osisi vine ọ na-esi na ya amịpụta mkpụrụ, otú ahụ ka ọ dịkwa anyị bụ ndị nọgidere na mmekọrịta anyị na Jizọs – anyị na-amị mkpụrụ – ma ọ bụ na-egosipụta àgwà nke Chineke site na ndụ anyị nye ndị ọzọ.

“Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma,

ikwesi-ntukwasi-obi, 'idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè: ọ dighi iwu nēmegide ihe nile di otú a Ndi Galetia 5:22-23

Mgbe omume nke Chineke na-arụ ọrụ n'ime anyị na site na anyị – ihunanya Ya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, 'idi-nwayọ, imerū-ihe-n'ókè anyị ga-aghọ ndị àmà dị irè dika anyị na-ebi ndụ anyị kwa ụbọchị.

Dị nnọọ ka ọ dị n’oge Jisọs, ngosipụta putara ihe, nke àgwà Chineke site na ndụ anyị – mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ – bụ ihe a na-apụghị ịgbagha agbagha. Ọ na-adọta uche nke ma ndị Kraịst ma ndị na-ekweghị ekwe, ọ bụghịkwa ihe ọhụrụ mmadụ ịjụ ajụjụ banyere ya.

“kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:” I Pita 3:15

Dị njikere. Mmadụ nwere ike na-ekiri ma ọ bụ jụọ ajụjụ gị mgbe ị na-atụghị anya ya. Ịgba ama nke onwe gị maka nzọpụta na ọrụ ebube nke Chineke na-aga n'ihu na ndụ gị bụ nnukwu mmalite. Ọzọkwa, akwụkwọ a bụ ngwá ọrụ ọzọ ị pụrụ iji nyere mmadụ aka ịghọta n’ụzọ dị mfe ozi dị ebube nke ịhụnanya na nzọpụta Chineke dịịrị mmadụ nile.

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

Ibi ndụ ọñụ, nke jupụtara n'nzube dabere na mmekọrịta, ịhụnanya na okwukwe. Ọ bụrụ na ị ka chọrọ idoanya karịa na atụmatụ Chineke maka ndụ gị, tinye atụmatụ a iji nyere aka lekwasị anya na nchụso gị na nchọta gị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig