Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!Ihe Atụ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

“Ịgosị Ndị Ọzọ Ịhụnanya”

Site n'ịhụnanya di omimi ma na-eto eto nye Chineke nke na-arụ ọrụ na ndụ anyị, ikike anyị ịhụ ndị ọzọ n'anya ga-etokwa n'onwe anyị. Site n'ịhụnanya na-eto eto nye ndị ọzọ ka ị ga-enweta ọchịchọ na-eto eto iji gosipụta ịhụnanya ahụ, si otú a na-emezu otu n'ime nzube kachasị mkpa nke Chineke kere anyị:

“N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.” Ndi Efesọs 2:10

Ọ dịlari n'atụmatụ Chineke oge niile ka anyị na-etinye ịhụnanya n'omume. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọnọdụ n’ime atụmatụ ukwu nke Chineke imetụ ndụ ndị ọzọ aka site n’omume ọma.

Oge ọ bụla anyị ji okwu dị mma metụ ndụ onye ọzọ aka, gboo otu mkpa, ma ọ bụ naanị na-aṅa ntị nye obi nọ na nwute, ọ bụghị nanị ịhụnanya anyị ka anyị n’egosipụta, kama ịhụnanya Chineke nwere n'ebe ha nọ site n'aka anyị. N’ụzọ dị otu a, anyị na-aghọ ndị isi ọrụ ga amụke ebube Chineke nke ọma n’ụwa nke jupụtara n’ọchịchịrị na enweghị olileanya. Tụlee okwu Jizọs:

“Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu. Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.” Matiu 5:14-16

Ịmuke ìhè anyị bụ nnọọ ikwe ka ìhè Chineke na-enwu site n'ime anyị. E nwere ụzọ atọ dị mkpa isi na-amukere ndị ọzọ ebube Chineke: ịbụ onye akaebe dị irè; na-ejere ndị ọzọ ozi; na iso Ndị Kraịst na-akpakọrịta. Itinye okwukwe anyị n’ọrụ n’ụzọ atọ ndị a na-enyere ndị ọzọ aka inweta ihunanya, amara na ebere nke Chineke, ha nile n’enye Ya otuto

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

Ibi ndụ ọñụ, nke jupụtara n'nzube dabere na mmekọrịta, ịhụnanya na okwukwe. Ọ bụrụ na ị ka chọrọ idoanya karịa na atụmatụ Chineke maka ndụ gị, tinye atụmatụ a iji nyere aka lekwasị anya na nchụso gị na nchọta gị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig