Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!Ihe Atụ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

“Ụkpụrụ Nke Ọlaedo”

Ma ọ̀ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ndú azụmahịa, onye ọkà okwu mkpali,, ma ọ bụ nanị onye na-adị kwa ụbọchị, ndị mmadụ sitere n’akụkụ nile nke ndụ na-atu aka mgbe ụfọdụ n’àgwà ọma nke Ụkpụrụ nke Ọlaedo ahụ . N'ezie, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na onye ọ bụla anụwo banyere ya ma mara ihe ọ pụtara.

Ọtụtụ ndị mmadụ ga-ekweta na “imere ndị ọzọ ihe anyị gaara achọ ka eme anyị” bụ akụkụ dị mkpa nke obodo. N'ọtụtụ akụkụ, ọ bụ akwa na-ejikọta omenala, ezinụlọ na ọbụbụ-enyi anyị ọnụ. Ụkpụrụ nke Ọlaedo ahụ na-egosipụta uru dị n'ijere ndị ọzọ ozi, na-enye mmesapụ aka na inyere ndị nọ ná mkpa aka.

Jizọs bụ onye dere Ukpuru nke Ọlaedo nke bụ otu n'ime ihe ndị kacha ebute ụzọ maka ibi ndụ Ndị Kraịst na-aga nke ọma. Jizọs kwuru, sị:

“Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.” Matiu 7:12

Dị ka Ndị Kraịst, Chineke na-akpọ onye ọ bụla n'ime anyị ka anyị buru okwukwe anyị gafere nanị ikwere na Chineke. Ọchịchọ ya bụ ka onye ọ bụla n’ime anyị tinye okwukwe anyị n’ọrụ site n’inyere ndị ọzọ aka, we si otú a na-enye Chineke otuto site n’igosi ịhụnanya na amara Ya n’ebe ha nọ. Nke a bụ ihe ọpụtara ibi ndu n’Ụkpụrụ nke Ọlaedo n'ezie.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

Ibi ndụ ọñụ, nke jupụtara n'nzube dabere na mmekọrịta, ịhụnanya na okwukwe. Ọ bụrụ na ị ka chọrọ idoanya karịa na atụmatụ Chineke maka ndụ gị, tinye atụmatụ a iji nyere aka lekwasị anya na nchụso gị na nchọta gị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig