Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!Ihe Atụ

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

“Igodo nke Mmekọrịta Dị Nma”

Mmekọrịta ọ bụla, ma ọ bụ enyi, onye òtù ezinụlọ, dị ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ya na Chineke, nwere ntọala abụọ dị mkpa na-eme ka ọ gaa nke ọma: ịhụnanya na mmetụta a na-enwerịta n'etiti ndị mmadụ n'otu n'otu, na itinye ịhụnanya ahụ n'ọrụ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-enwetakarị ezi ịhụnanya site n’omume; ezi enyi na-ahụ onye ọzọ nọ ná mkpa ga-eji enyemaka nyere ya aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa ná mmekọrịta anyị na Chineke. A na-enwetakarị ezi ịhụnanya nye Chineke site na omume; imetụ obi Chineke aka site n’imetụ ndụ ndị gbara anyị gburugburu aka.

Ime ezigbo ihe n'ime mmekọrịta anyị na ndị ọzọ na-amalite site na mmekọrịta anyị na Chineke. N'ezie, Chineke na-arịọ ka mmekọrịta anyị na ndị ọzọ bụrụ ndọtị nke mmekọrịta anyị na Ya. Tụlee iwu abụọ kachasị nke Akwụkwọ Nsọ dị ka Jizọs kwuru:

“i gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n'anya, site n'obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n'uche-gi dum, site kwa n'ike-gi dum. Nke-abua bu nke à, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Ọ dighi ihe ọzọ enyere n'iwu nke dikariri ndia.” Mak 12:30-31

Dịka ndị kwere ekwe, mmekọrịta anyị na Chineke n’otu ụzọ na mmekọrịta anyị na ibe anyị n’ụzọ nke ọzọ bụ ihe kachasị mkpa nye Chineke – ịhụ Ya n'anya na ịhụ ndị ọzọ n'anya.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Bie Ndụ nke jupụtara ná Nzube!

Ibi ndụ ọñụ, nke jupụtara n'nzube dabere na mmekọrịta, ịhụnanya na okwukwe. Ọ bụrụ na ị ka chọrọ idoanya karịa na atụmatụ Chineke maka ndụ gị, tinye atụmatụ a iji nyere aka lekwasị anya na nchụso gị na nchọta gị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig