Ike nke AmamiiheIhe Atụ
Ụkpụrụ nke onye maara ihe
Ike nke amamiihe na-apụta n'agwa na ụdị ndụ onye ahụ na-ebi. Amamiihe nwere ikike ijide, iwoghari ma gbanwee echiche nke mmadụ. Ilu 2:20 kwụrụ sị, ka i wee jee ije n'ụzọ ndị dị mma, ma dekwara okporo ụzọ niile nke ndị ezi omume.
Ndị niile o masịrị n'iga ije n'amamihe nke Chineke na-eji desi ike ụkpụrụ nke onye maara ihe. Site n'ih dị iche iche e dere n'akwụkwọ Nsọ Ilu 2:1-7: Tupu onye ọbụla ga-aghọta ịtụ egwu nke Chineke, mq chọta ihe ama ama nke Chineke, nke bụ usoro nke mmepụta amamiihe. E nwere mkpụrụokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ e jiri kọwaputa nke ọma ụkpụrụ nke onye maara ihe.
Mmadụ kwesịrị ị mata etu esi a ata ihe na izo okwu si na Chineke. (Ilu 2:1-2). Okwu nke Chineke bụ ihe dị mkpa maka mejupụta nke amamiihe. N'ilu na-akụzi ihe nke onye ọ gha mkpụrụ, nke edeturu n'akwụkwọ Matiu 13:1-23; Otu ụdịdị mkpụrụ ahụ ka a kụrụ mana ọ bụ naanị obi nke chọrọ nghọta mịtara mkpụrụ. Onye maara ihe na-achọ inweta nghọta gbasara ihe Chineke na-ekwu n'ihu akwụkwọ Nsọ ụbọchị niile na site ihe nkwadebe nke Mmụọ Nsọ, nke nwere ike ịbịa site na na nrọ maọbụ site n'ịhụ ọhu.
Amamiihe na-eme onye maara ihe ka o nwee oke agụụ maka inwe ihe nghọta. (Ilu 2:3-4) Ọchịchọ nke amamiihe na-eme onye maara ihe ka ojidesie omume nwa Chineke nke ejiri mara ya. N'akwụkwọ Ilu 3:7 kwuru sị, Abụla onye maara ihe n'anya gị onwe gị, bụrụ onye na-atụ egwu Chineke, wee si n'ihe ọjọọ wezuga onwe gị. Otu ezigbo ihe si n'ịchọsi Chineke ike bụ ndụ nke jupụtara na ntụkwasị obi.
Amamiihe bụ mmadụ nke ụdịdị ya dịka Jizọs Kraịst. Mgbe ị tụgharịrị uche n'akwụkwọ Ilu 8:1, Ị ga-achọpụta na amamiihe na-eti si mkpu ike. N'agba ọhụrụ, Akwụkwọ Nsọ kọwara Jizọs Kraịst nke ọma dịka amamiihe nke Chineke. (Ndi Kọrịnt 1:24).
Ndụ dị na mpaghara dị iche iche, ọ bụ amamiihe, ịchọpụta Chineke anyị bụ Jizọs Kraịst. Ọ maara ụzọ ka mma iji wee gboo mkpa niile na etu ọ ga-esi nwee mmeri n'agha niile nke ndụ. Jizọs, onye bụ amamiihe nke Chineke kwupụtara n'akwụkwọ Matiu 11:28-30 "Biakwute m...aga m enye gi ezumike. Ụkpụrụ nke onye maara ihe, ọ bụ ya ka ọ dị n'aka ị na-achọsi ya ike mgbe niile ma sorokwa Jizọs Kraịst.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ilu 8:17-22, Abụọma 119:130, Isaiah 55: 6-7
Ekpere: Nna nyere m aka mgbe ọbụla ịcho gị n'ime mmụọ na eziokwu. Jizọs were aka gị dị ike jigide m n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ihe ọmụmụ gbadoro ukwu n'ihe gbasara ihe nrite nke ị ga-ije n'amamihe. Iweta amamiihe nke na arụ ọrụ bụ ihe nzuzo nke ibi ndụ gaara nke ọma ma mezuo kwa akaraka.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg