Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ike nke AmamiiheIhe Atụ

Ike nke Amamiihe

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ụzọ nke Nghọta

Nkuzi na mkparịtaụka agbasara ụdịdị akụkụ amamiihe nke Chineke, bụ na mmadụ kwesịrị ị ga-ije na nghọta. Ọ bụ nghọta ga-eme ka mmadụ jide ghara ịtụfu metụta ụda nke amamiihe. Onye ọbula amamiihe kọrọ ụkọ, ọ ga-ara ahụ ị ga-ije n'amamiihe nke Chineke.

Ilu 4:7 kwuru sị, Isi ihe ka amamiihe bụ, nweta amamiihe, ya mere were ihe niile inwetaworo nweta nghọta. Amamiihe bụ ihe nke mmụọ ya mere ị ga-ije n'ụzọ nghọta bụ ya ga-ewuli mmụọ nke mmadụ.

E nwere nghọta nke eji etinye amamiihe nke Chineke n'ụro, n'ihe niile gbasara nke ndụ. Ụzọ nke nghọta bụ ịhụ ihe na ntụzi aka nke Chineke. Job 33:12-14 kọwara nke ọma : Na Chineke dị ụkwụ karịa mmadụ. Ya mere ọ ga-ara mmadụ ahụ ị ga ije na nghọta ma ọ bụrụ na Chineke enyereghi onye ahụ aka. Ụzọ nghọta bụ ụzọ nke Kraịst. Jizọs bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. (Jọn 14:6). Mgbe mmadụ bidoro ná-atụgharị uche n'echiche n'ime ihe nke Jizọs Kraịst gwara ya onwe ya ma ọbụ ọha, site n'akwụkwọ Nsọ, mmadụ ahụ kwesịrị ime nke ọma n'amamiihe.

Nghọta nke sitere n'okwu Jizọs ga-akụziri mmadụ ndị ha na ya ga na-enwe mmkpakọrịta, ụdị ihe onye ahụ chọrọ, aka ọrụ, ụdịdị onye o kwesịrị ka ọ lụọ na ihe ndị ọzọ. Job 32:7-8 kọwara nke ọma, "Asịrị m ụbọchị bara ụba ga-ekwu okwu, ọtụtụ afọ ga emekwa ka a mara amamiihe. N'ezie mmụọ dị n'ime mmadụ, iku ume nke onye pụrụ ime ihe niile na-emekwa ka ọ ghọta ihe. Site na mmadụ ịgbasi ike n'ekpere na ndụ, onye ahụ ga-erite uru na nghọta site n'enyemaaka nke Mmụọ Nsọ. Ị ga-ije na nghọta, anyị ga-eweli olu anyị elu bee ákwá maka nghọta. Onye adịghị ike n'ekpere bụ onye nghọta kọrọ ụkọ.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ : Abụ ọma 36:9, Isaiah 30:21, Jeremaya 33:3, Matiu 4:4

Ekpere: Nna Mepee anya m n'ụzọ nke nghọta n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ike nke Amamiihe

Ihe ọmụmụ gbadoro ukwu n'ihe gbasara ihe nrite nke ị ga-ije n'amamihe. Iweta amamiihe nke na arụ ọrụ bụ ihe nzuzo nke ibi ndụ gaara nke ọma ma mezuo kwa akaraka.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg