Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ike nke AmamiiheIhe Atụ

Ike nke Amamiihe

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Isi iyi nke Amamiihe

Ụdọdị nke amamihe bụ mgbaziri ụzọ. Isi iyi nke amamiihe si apụta ihe, ọ na ezipụta, site n'ụdị mgbazi e nyere onye tinyere ya n'ọrụ. N'akwụkwọ Ilu 2:6-7 kwụrụ sị, N'ihi na Chineke na-enye amamiihe... Ọ na-ezobere ndị ziri ezi nzube ihe. Amamiihe isi iyi nke ụda bụ n'aka Chineke ka o si abia. E nwere ọtụtụ ụzọ e si enweta isi iyi amamiihe e dere n'ime akwụkwọ nsọ Jemsi 3:13-17.

Amamiihe nke ụwa: Amamiihe sitere n'isi iyi nke ụwa. Ọ bụ ụdịdị amamiihe a ka a na-akpọ amamiihe nke mmadụ. Mmadụ nwere ike inweta ụdị amamiihe ahụ site na nghọta nke mmadụ maọbụ site na mkpughe nke nkụja. Ụdịdị amamiihe a nwere njedebe maka na ihe metụtara mmadụ nwere njedebe.

Amamiihe nke Ekwensu: Nkea bụ ụdịdị amamiihe nke Ekwensu ndị ọrụ ya na-akwagide.

Ụdịdị amamiihe nke Chineke : Ụdịdị ụda amamiihe nke Chineke bụ isi iyi nke amamiihe. Onye ọbụla ga-achọsi ike ị ga ihe na ibi ndụ n'ụdịdị amamiihe nke Chineke. Ụdịdị amamiihe ndị ọzọ esiteghị n'amamihe Chineke bụ omume rere ere. N'akwụkwọ Jemsi 3:13-15 dị ka amamiihe nke nwere ekworo dị ilu na ịkpa iche iche, unu anyala isi, unu ekwukwa ala okwu ụgha megide ezịokwu.

Ụdịdị amamiihe nke Chineke bụ ị dị ọ cha, inwe udo, ị dị nwayọọ, o nweghị ihe ọzọ n'abughị ịmịta ezi mkpụrụ, jupụta n' obi ebere na amitakwa ezigbo mkpụrụ, ọ naghị akpa oke, ọ bụghị kwa onye mma ihu abụọ. N'ịga ije n'ụdịdị amamiihe nke Chineke, anyị ga-agba mbọ mịa mkpụrụ n'ịtu egwu Chineke n'ihe niile anyị na-eme. Ebe mgbakwasị ụkwụ nke ụdịdị amamiihe Chineke bụ ihiwe isi gbakwasiri ụkwụ bụ na anyị agaghị abụ ndị ngwakọrịta ma abịa n'ihe gbasara ezi omume. Ịtụ egwu nke Chineke ga-eme ka mmadụ selata aka maọbụ wezụga onwe ya n'omume rere ere n' ime ụwa a ma mee ka mmadụ kpachapụ anya na ndụ ọ na-ebi.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ : Genesis 39:7-9, Ilu 13:6, Ilu 9:10

Ekpere : Nna nyere m aka ka m gaa ije n'ịtu egwu Chineke nke ga-eme ka m bie ndụ n'ụda amamiihe nke gị n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ike nke Amamiihe

Ihe ọmụmụ gbadoro ukwu n'ihe gbasara ihe nrite nke ị ga-ije n'amamihe. Iweta amamiihe nke na arụ ọrụ bụ ihe nzuzo nke ibi ndụ gaara nke ọma ma mezuo kwa akaraka.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg