Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ike nke AmamiiheIhe Atụ

Ike nke Amamiihe

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Nghọta nke Amamiihe

Ịgba ọsọ mmeri na ndụ a, mmadụ ga-agba mbọ ịghọta ụkpụrụ nke amamihe na etu amamiihe si arụ ọrụ. Onye ihe na-agara nke ọma dịka njem a tụrụ anya n'ịgba ọsọ ndụ a, mara na onye ahụ nwere amamiihe. N'akwụkwọ Ilu 4:7 kwuru si: Isi ihe ka amamiihe bụ, ya mere, nweta amamiihe, n'ihe niile inwetaworo nweta nghọta.

Amamiihe bụ ezi ụzọ nke dabara n'ihe ama ama. Ọ bụrụ na mmadụ ga-abụ onye ihe na-agara nke ọma maọbụ nweta ihe ọ chọrọ na ndụ a, ọ kwesịrị ka a kọwaara ya ezi ụzọ maọbụ nghọta gbasara ihe ahụ akpọrọ ya ka ọ mee. N'akwụkwọ Ekliziastis 8:1 nke kwụrụ si : onye dịka onye maara ihe? Onye na-amaka akụkọ isi okwu? Amamiihe mmadụ na-enye ihu ya ìhè, ìhè nke ihu ya na-agbanwekwa. Mgbe mmadụ na-enweghi amaiihe n'ụzọ nke ndụ ya, ọ na-ebute nda ghachi azụ na mgbegwoju anya. (Ekliziastis 10:15-17).

Site n'ihe dị iche iche e dere n'akwụkwọ nsọ Ilu 2: 1-6, Anyị chọpụtara na e nwere iwu na ntụzi aka nke mụpụtara amamiihe. Ilu 2:1 kwuru si - Nwa m, ọ bụrụ na ị nara amamiihe, ọ bụrụkwa na izobe ihe niile m nyere n'iwu n'ebe ịnọ, ihe ntụzi aka niile nke amamiihe ga-apụta ìhè maọbụrụ na anyị egee ntị ma debe ihe niile e nyere dịka ntụzi aka gbasara ya.

N'ịghọta amamiihe, ị ga-agba mbọ meghee obi gị ịnabata ntụzi aka na iwu. Dịka mgbe onye na-arụpụta ihe dị iche iche ga-ewepụta ihe nlere anya oji wee rụpụta ihe ahụ. Chineke wepụtaara anyị ihe nlere anya nke anyị ga-agbaso. Ihe nlere anya ahụ bụ akwụkwọ Nsọ, ebe e dere ihe ntụzi aka niile nke ga-eme ka mmadụ bụrụ onye nwetara ihe ọ chọrọ na ndụ. N'ịghọta ihe bụ amamiihe anyị ga-agba mbọ gee ntị na ntụzi aka nke di n'akwụkwọ Nsọ.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ : Jọshụa 1:8, Ọpụpụ 18:18-24, Ilu 1: 1-7

Ekpere: Nna ana m arịọ ka inye m, amara irubere ntụzi aka niile isi nke ga-eme ka m jee ije n'amamiihe n'aha Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ike nke Amamiihe

Ihe ọmụmụ gbadoro ukwu n'ihe gbasara ihe nrite nke ị ga-ije n'amamihe. Iweta amamiihe nke na arụ ọrụ bụ ihe nzuzo nke ibi ndụ gaara nke ọma ma mezuo kwa akaraka.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg