Nhọrọ nwere nsonaazụIhe Atụ
Ikpe Na-abịa
Amaokwu a na-adọ anyị aka ná ntị na ọ dịghị mgbapụ n'ikpe nke Chineke maka ndị na-eme ihe ọjọọ.
Ime ihe na-ezighị ezi n'ebe a kwekọrịtara ihe amaokwu ndị bu ụzọ nwere ikwu maka ya, - ịhọrọ ndụmọdụ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ije ije n'ụzọ ndị mmehie, nhọrọ kpachaara anya ileghara okwu Chineke anya.
N'ebe ọ gbasara ndị mmadụ a, ikpe bụ ihe dịrị ha. Ha ga-abụ ndị ekewapụrụ site na ndị na-eme ihe ziri ezi, ha ga-eche ihu nsonaazụ nke omume ha.
Amaokwu a na-echetara anyị na nhọrọ anyị nwere nsonaazụ ebighi ebi, nakwa na anyị ga-eche ikpe Chineke ihu otu ụbọchị. Anyị kwesịrị ịhọrọ iso ụzọ Chineke ma zere ime ihe ọjọọ.
EKPERE:
Nyere m aka ime ihe ziri ezi ma zere ime ihe ọjọọ. Ka a gụọ m n' etiti ndị ezi omume, bụrụkwa onye nọ ná nchebe n' ụbọchị ikpe. Amen
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche Akwụkwọ Nsọ Banyere Abụ Ọma 1:1-5 Otu n'ime ngọzi kachasị nke chineke nyere mmadụ bụ ikike ime nhọrọ. Chineke na-echetara anyị ọzọ na, otu ọbụla anyị kpebiri iji ike nke ime nhọrọ nakwa nhọrọ ọ bụla anyị nke anyị na-eme, e nwere ihe ga-esi na ya pụta.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d