Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nhọrọ nwere nsonaazụIhe Atụ

Nhọrọ nwere nsonaazụ

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ndụ Gbanyere Mkpọrọgwụ N'okwu Chineke

Abụ Ọma 1:3 na-akọwa onye kwere ekwe nke na- ahọrọ ịtụgharị uche n'okwu Chineke, onye kwere ekwe nke na-enwe obi ụtọ ịmụ ma na-atụgharị uche n'okwu Chineke.

Onye kwere ekwe nke na-eme ihe edere n'amaokwu 1-2 bụ onye kwere ekwe nke ndụ ya gbanyere mkpọrọgwụ n'Okwu Chineke.

Osisi a kụrụ n'akụkụ osimiri mmiri na-akọwa ndụ nke Okwu Chineke na-edozi ahụ, nke na-amị mkpụrụ n'oge ya.

Akwụkwọ nke na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ na-egosipụta ahụ ike ime mmụọ nke na-adịgide adịgide. Nkwa na ihe ọ bụla anyị na-eme ga-enwe ọganihu na-eme ka ngọzi na nduzi Chineke pụta ìhè ná ndụ anyị.

Ka anyị na-atụgharị uche n'amaokwu a, a na-echetara anyị na ndụ gbanyere mkpọrọgwụ n'Okwu Chineke bụ ndụ nke nwere nzube na ihe nke ọ pụtara. A kpọrọ anyị ka anyị mịa mkpụrụ maka ebube Chineke. Okwu Chineke na-enyekwa anyị nri ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

Dịka osisi si n'osimiri na-adọta ihe oriri, anyị na-adọta ike na nduzi site na Akwụkwọ Nsọ.

EKPERE:

Ezi Nna m, Nyere m aka ka mkpọrọgwụ m bụrụ ihe na-anọgide n'okwu gị. Ka ndụ m bụrụ ihe àmà nye ịdị mma na amara gị, ka mgbalị m wee nwee ọganihu dịka uche gị si dị. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nhọrọ nwere nsonaazụ

Echiche Akwụkwọ Nsọ Banyere Abụ Ọma 1:1-5 Otu n'ime ngọzi kachasị nke chineke nyere mmadụ bụ ikike ime nhọrọ. Chineke na-echetara anyị ọzọ na, otu ọbụla anyị kpebiri iji ike nke ime nhọrọ nakwa nhọrọ ọ bụla anyị nke anyị na-eme, e nwere ihe ga-esi na ya pụta.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d