Nhọrọ nwere nsonaazụIhe Nhụchatụ

Ụzọ Doro Anya Na-eduga n'Amamihe
Abụ Ọma 1:2 na-ekpughe ihe nzuzo nke ndụ amamihe: inwe obi ụtọ n'Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị.
Site n'amaokwu a, ọ dịghị onye kwere ekwe kwesịrị enweghị amamihe, n'ihi na ihe ngwọta bụ okwu Chineke.
Inwe obi ụtọ n'ebe ihe ọbụla nọ pụtara inwe mmasị dị ukwuu na ya, ma mee ka ọ bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ nke ọma.
Mgbe Okwu Chineke na-atọ anyị ụtọ, anyị na-enwe ọṅụ n'ịgụ, ịmụ, na ime ihe ọ na-akụzi.
Inwe mmasi n'ebe Okwu Chineke nọ ma na-atụgharị uche na ya kwa ụbọchị na-enye ọtụtụ uru. Anyị na -enweta amamihe ga-enyere anyị aka ịnyagharị ihe ịma aka nke ndụ, nkasi obi n'oge nsogbu, nduzi maka mkpebi anyị na-eme, na ike maka ibi ndụ ezi omume. Okwu Chineke na-aghọ kọmpasị nke ndụ anyị, na-eduzi anyị n'ụzọ nke ezi omume.
Ka anyị na-atụgharị uche n'Okwu Chineke, anyị ga-amalite ịhụ ụwa site n'anya Ya. Anyị ga-amata echiche Chineke banyere ndụ, ma ghọta atụmatụ ya na ebumnuche ya banyere anyị.
EKPERE:
Nna, nyere m aka ka m nwe obi ụtọ n'okwu gị.
Nyere m aka ka m na-enwe mmasị ịtụgharị uche n'okwu gị na ibi ndụ site na ya, ka m wee nweta amamihe. Amen
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Echiche Akwụkwọ Nsọ Banyere Abụ Ọma 1:1-5 Otu n'ime ngọzi kachasị nke chineke nyere mmadụ bụ ikike ime nhọrọ. Chineke na-echetara anyị ọzọ na, otu ọbụla anyị kpebiri iji ike nke ime nhọrọ nakwa nhọrọ ọ bụla anyị nke anyị na-eme, e nwere ihe ga-esi na ya pụta.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d