Nhọrọ nwere nsonaazụIhe Atụ
Nhọrọ Bụ Nke Gị
Otu n'ime ngọzi kachasị nke Chineke nyere mmadụ bụ ikike ime nhọrọ. Site n'ikike a, anyị nwere ike ikpebi ihe ga-eme ná ndụ anyị.
Abụ Ọma 1:1 bụ amaokwu Baịbụl ahụ nke na-echetara anyị na, ikike Chineke nyere mmadụ iji mee nhọrọ nwere nsonaazụ dịrị ya.
Otú ọbụla anyị kpebiri iji ikike ahụ mee ihe, anyị ga-aghọrọ nsonaazụ nke nhọrọ ndị ahụ mgbe niile.
Abụ Ọma 1: 1 na-echetara anyị na nhọrọ anyị nwere nsonaazụ, anyị aghaghịkwa ịkpachara anya họrọ ije ije n'ezi omume.
Anyị nwere ikike ịhọrọ ndị enyi anyị, ndụmọdụ anyị, na echiche anyị. Anyị nwere ike ịhọrọ iji ndị na-ebulite anyị elu ma na-akwado anyi, ma ọ bụ ndị na-adọkpụ anyị n'ala gba onwe anyị gburugburu. Anyị nwere ike ịchọ nduzi site n'Okwu Chineke, ma ọ bụ site n'amamihe nke ụwa.
Anyị nwere ike ịhọrọ ịtụgharị uche n'iwu Chineke, ehihie na abalị, ma bie ndụ n'ime ngọzi na ọganihu. Ma ọ bụ, anyị nwere ike ịhọrọ ịgbaso ụzọ ndị ajọ omume ma taa ahụhụ ga-esi na ya pụta.
EKPERE:
Ezigbo Nna nke Eluigwe,
Daalụ maka ngọzi nke ị nyeworo anyị, na ikike ịme nhọrọ. A na m ekpe ekpere taa ka ị nyere m aka iji ikike ahụ họrọ naanị ihe ndị ahụ na-akwalite mmasị alaeze gị. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche Akwụkwọ Nsọ Banyere Abụ Ọma 1:1-5 Otu n'ime ngọzi kachasị nke chineke nyere mmadụ bụ ikike ime nhọrọ. Chineke na-echetara anyị ọzọ na, otu ọbụla anyị kpebiri iji ike nke ime nhọrọ nakwa nhọrọ ọ bụla anyị nke anyị na-eme, e nwere ihe ga-esi na ya pụta.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d