Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Akụkọ EkeresimesiIhe Atụ

The Christmas Story

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ịzọpụta Ụwa

Jizọs bụ Onye Nzọpụta ahụ e kwere ná nkwa ma bụrụkwa Ọkpara Devid, ma olee otú Ọ si bie ndụ kwekọrọ n'aha ndị a e turu Ya? A sị ka e kwuwe, ụwa ka dị njọ na ntiwa ọtụtụ puku afọ Ọ bịasịrị. Ya mere, olee otú Jizọs sịrị mezuo ozi Ya?

Ọtụtụ mmadụ nwere atụmanya maka ihe Onye Nzọpụta ga-adị ka. Ụfọdụ chere na Ọ ga-abụ dike n'agha nke ga-achụpụ ndị iro ha. Ndị ọzọ chere na Ọ ga-abụ onye ikpe siri ike, na-ama ndị mmehie ikpe. Ma ọ dịghị onye tụrụ anya na Jizọs ga-apụta ka ụdị onye Ọ bụ.

Jizọs ji ndị nkịtị gbaa onwe Ya gburugburu. Ọ kụzịịrị ndị mmadụ otu ha na Chineke ga-esi n'enwe mmekọrịta site n'ilebara ndị mmadụ anya. Jizọs rụrụ ọrụ ebube gasị bara uru nye ndị e weere dị ka ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị dị mgbaji n’ụzọ ime mmụọ. Jizọs na ndị mmehie rịkọrọ nri ma Ya enye ndị nwere nsogbu na ntaramahụhụ olileanya.

Jizọs maara na ọ dịghị uru ọbụla ọ ga-abara ụwa ma ọ nwe onye ọchịchị ọzọ dị ike. Ihe ga-abara anyị uru bụ ihe dị omimi karịa: ụzọ ndụ ọhụrụ gbanyere mkpọrọgwụ n'ịdị umeala n'obi, mgbaghara, na mmesapụ aka. Ụzọ ndụ a na-ewulite njikọ n'etiti ndị ọzọ, na-ewetara ndị na-eche na ha enweghị isi olileanya, ma na-echetara anyị na anyị bụ akụkụ nke ihe ka anyị onwe anyị.

Ma Jizọs bụụrụ anyị nke ukwuu ihe nlereanya dị mma karịa. Ọ bụ Chineke nọnyeere anyị. O nyefere ndụ Ya wee bilie na ndị nwụrụ anwụ ka O meere anyị niile ụzọ inweta ezi mgbaghara na-adịgide adịgide.

Akụkọ Ekeresimesi bụ nlebanya siri ike nke ndụ Jizọs. Ọ na-echetara anyị ihe Chineke dị ka na otú Ọ si azọpụta ụwa. Kwa ụbọchị, ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ahọrọ mgbaghara, na-emesapụ aka, na-emekwa nhọrọ dị uru karịa nye ndị ọzọ. Nke ọ bụla n'ime nhọrọ ndị ahụ na-eme ka ụwa dịkwuo ka eluigwe.

N'oge Ekeresimesi, Chineke nyere ụwa Ọkpara Ya dịka onyinye. Ọ bụ onyinye nke a kpachara anya nye, nke nwe, na nke mgbaghara. Ọ bụkwa onyinye enyere anyị ikike ịkesara ya ndị ọzọ.

Kpee Ekpere: Ezigbo Chineke, a na m ekele Gị maka amara Gị na nlebara anya Gị n’ebe anyị nọ. Daalụ maka inye mgbaghara na nzube site na Jizọs. Nyere m aka ịchọta ụzọ m ga-esi dịkwuo ka Jizọs kwa ụbọchị. N’aha Jizọs, amen.

Ihe Ịma Aka: Anyị niile na-aga njem ndụ nke ịdịkwu ka Jizọs. Ederede a nwere ike inyere onye ọ bụla aka ịchọpụta nzọụkwụ ọzọ ha ga-eme n'iso Jizọs.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Christmas Story

Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka ịnye Atụmatụ Ihe Ọgụgụ a. Maka ozi ndi ozi, biko gaa na www.life.church