Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Akụkọ EkeresimesiIhe Atụ

The Christmas Story

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Anyị Abịawo Ife Ya Ofufe

Chineke kpọrọ ụdị ndị mmadụ abụọ òkù ka ha bịa mee ememe ọmụmụ Jizọs. Ụdị mmadụ abụọ ndị a dị ịtụnanya, ha abụọ na-agwakwa anyị ihe ụfọdụ gbasara Chineke.

Ọkpụkpọ òkù nke mbụ bụ nke a kpọrọ ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ dị n'ime obodo. Otu mmụọ ozi pụtara ma zie ha yabụ ozi ọma. Ka e mesịrị nke a ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ewee gaa ife Jizọs ofufe.

Akpụkpọ òkù nke abụọ bụ nke ezipụrụ nye ndị ụwa. Mgbe a mụsịrị Jizọs, otu kpakpando biliri bịa nọrọ n’elu Betlehem. Otu ìgwè ndị si n’akụkụ ọzọ nke ụwa hụrụ kpakpando ahụ wee soro ya. Anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere ha ma ọ bụ mmadụ ole mere njem ahụ. Mana ha chọtara Jizọs wee jiri onyinye dị iche iche fee Ya ofufe.

Ya mere, gịnị ka anyị ga-amụta na ndị ọbịa abụọ a bụ akụkụ nke Akụkọ Ekeresimesi? Tinyere ihe ndị ọzọ, ọ na-egosi anyị otú Jizọs si achịkọta ụdị mmadụ niile ka ha bụrụ otu.

Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dịkà Meri na Josef. Ha bụ ndị nkịtị si n'obere obodo, na-enweta ihe ha na-eri site n'ọrụ gasị na-akpata obere ego.

Mana ndị ọbịa ahụ si mba ọzọ aghaghị ịdị iche karịa. Ha si ná mba ọzọ, o nwekwara ike ịbụ na ha kweere n'ihe dị iche. O yikwara ka hà nwere akụ̀ na ụba na ikike, bụ́ nke kọrọ Meri na Josef.

Anyị ma na ndịiche nwere ike ikewa ndị mmadụ. Anyị niile ahụla ya n'ọrụ, na mmekọrịta anyị nakwa na ndụ nke ndị ọzọ. Mana Akụkọ Ekeresimesi na-emepụta njikọ nye mmadụ niile. Chineke chọrọ ka onye ọ bụla soro buru akụkụ nke ezinụlọ Ya. Ya mere Chineke jiri kpọọ ndị nọ nso na ndị si n’ebe dị anya ka ha bịa mee ememe ọmụmụ Jizọs.

Ọmụmụ Jizọs na-achịkọta ndị dị iche iche ka ha dị n'otu. Anyị bu ụzọ hụ nke a n’Akụkọ Ekeresimesi, ma ọ bụ isiokwu n'achị achị dị ugboro ugboro na ndụ Jizọs. Ọ mere ka Ya na ndị si n'ebe dị iche iche dị na mmekọrịta. Sitekwa na mmekọrịta ndị ahụ, Ọ nyere aka tibie ihe mgbochi ọha mmadụ, nke akụ̀ na ụba, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị na-achọkarị ikewa anyị.

Chineke na-ewu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ—ya mere Ọ na-edu anyị ka anyị hapụ echiche ahụ bụ “ka anyị megide ha”. Ma nke ahụ bụ otu n'ime ihe ndị anyị na-eme ememe ya na Ekeresimesi: Jizọs na-egosi anyị ike nke ịdị umeala n'obi, ịdị na njikọ na inwe obi ọmịiko.

Kpee Ekpere: Ezigbo Chineke, daalụ maka ịkpọ m ka m bụrụ akụkụ nke ezinụlọ Gị zuru ụwa ọnụ. Biko nyere m aka iburu n'uche otu mụ na ndị dị iche ga-esi dị na njikọ ma wulite ụdị njikọ ahụ. Gosikwa m onye m nwere ike ịkpọ òkù ka Gị na ya nwee mmekọrịta. N’aha Jizọs, amen.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Christmas Story

Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka ịnye Atụmatụ Ihe Ọgụgụ a. Maka ozi ndi ozi, biko gaa na www.life.church