Akụkọ EkeresimesiIhe Atụ
Kasie Ndị M Obi
Akụkọ ekeresimesi jupụtara n'ihe ndị ana-atụghị anya na ya. N'ime ụbọchị ise na-abịa, anyị ga-enyocha ntụgharị na njegharị nke akụkọ ochie a ma chọpụta ihe ọ pụtara nye anyị ụbọchị taa.
Ọ dịtụla mgbe ọ dị gị ka Chineke Ọ nọ ebe dị anya nye gị? Ikekwe ọ dị gị ka Ọ gbachiri nkịtị ma ọ bụ na Ọ hụghị ihe ị na-agabiga. Ọ bụrụ na ọ dị gị òtù ahụ, ọ bụghị naanị gị n'agabiga nke a.
Were ya na ị so ná ndị obodo ndị iro wakporo. Ha ana-achị obodo gị ma na-eme ka ndụ siere gị ezigbo ike. Ị tolitere na-anụ banyere ịhụnanya Chineke nwere n'ebe ndị gị nọ. Ma ka afọ na-aga, ị nwere ike na-eche, Chineke Ọ̀ nọnyeere anyị n’ezie?
Nke a bụ otú obi dị ọtụtụ ndị Izrel oge ochie n’afọ ndị gaferenụ tupu ọbịbịa Jizọs. Ọtụtụ ndị ọchịchị rụrụ arụ kpagburu ha ma megbuo ha. Mana ọtụtụ ndị kweere na Chineke ga-ezite Onye-nzọpụta ka ọ tọhapụ ha ma weghachi ha na izu-oke.
Ị̀ na-ahụ onwe gị mgbe ụfọdụ ka ị na-echere ma na-ekpe ekpere ka ihe gbanwee ma ị maghị ma Chineke Ọ̀ ga-aza gị maka yabụ ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ọ dị gị ka ọ si dị ụfọdụ ndị ụmụ Izrel n'oge ahụ. Ma ọbụnadị na nchere ha, Chineke nọnyeere ha.
Ma Chineke anọghị emeghị ihe ọbụla. Ọ nọ na-arụ ọrụ n'azụ iji mee ihe dị ịtụnanya na dị ebube karịa ka onye ọ bụla nwere ike iche n'echiche.
Ọ bụghị naanị na Ọ zitere onye nzọpụta. Ọ bịara n'onwe Ya. Ma ọ bụghị dị ka onye ọchịchị dị ike ma ọ bụ onye agha siri ike. Kama, Ọ wedara Onwe-ya ala, wee ghọ nwa n'afọ nke otù nwa-agbọghọ ana-akpọ Meri.
Ọ bụrụ na ị na-eche ma Chineke Ọ nọnyeere gị, chee echiche banyere akụkọ Ekeresimesi. N'ihi na Chineke nọ ya mgbe niile ma na-arụ ọrụ, ọbụlagodi mgbe anyị ejighị anya anyị abụọ ahụ ya.
Kpee Ekpere: Ezigbo Chineke, Daalụ maka ịnọnyere anyị. Biko nyere m aka ịtụkwasị Gị obi ọbụlagodi mgbe m n'enweghị ike ịhụ ọnụnọ Gị. Nyere m aka inwe obi sie ike n'ịhụnanya Gị ka m na-atụgharị uche na akụkọ a magburu onwe ya nke Ekeresimesi. N’aha Jizọs, amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.
More