Akụkọ EkeresimesiIhe Atụ
Nwa Nke Devid
Olee otu ị ga-esi gwa onye ị ga-alụ na ị dị ime Onye Nzọpụta nke Chineke kwere ná nkwa? Nke ahụ bụ ajụjụ Meri nwere ike ịjụ onwe ya mgbe ọ nwetasịrị ozi ọma ahụ. Mgbe Josef chọpụtara, o kpebiri ná mmalite ịhapụ mmekọrịta ya na Meri. Mana Chineke chọkwara itinye Josef n’ime akụkọ a.
N’Akwụkwọ Nsọ nke taa, Chineke zitere Josef onye ozi, nke gwara ya ihe niile n'eme. Onye ozi ahụ kpọrọ Josef “nwa nke Devid,” nke sitụrụ ike ịghọta, n’ihi na Devid abụghị aha nna Josef.
Devid dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ tupu Meri na Josef abata n'ụwa. O sikwa n'obere obodo, o bikwara ndụ nkịtị dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Mana otu ụbọchị, Chineke zipụrụ onye ozi ka ọ ga gwa Devid na a họpụtara ya ka ọ bụrụ eze.
Mgbe e mesịrị, Chineke kwere nkwa na otu n’ime ụmụ Devid ga-eke alaeze ọhụrụ dị mma nke pụrụ ịgọzi ụwa nile. Devid na ụmụ ya nwere ntụpọ gasị ma na-emekarị nhọrọ ndị n'adịghị nma, bụ́ nke dugara ná ọdịda nke alaeze ha. Ndị mmadụ maara na ọ bụrụ na ha gaje inwe alaeze ọhụrụ nke ka mma, na ọ dị mkpa ka ha nweta Devid dị ọhụrụ na nke ka mma. Ya mere, ruo ọtụtụ ọgbọ, ndị mmadụ nọ n'eche ka “Nwa Devid” bịa.
Nke a na-akpọghachite anyị na Josef, onye sitere n'eriri ezinụlọ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ghọrọ eze. Josef ezughị okè, dị ka ụmụ Devid ndị ọzọ si n'isi ruo mgbe ahụ, ma ezi Ọkpara Devid ahụ n'enweghị ntụpọ na-abịa n’ụwa site n’aka Meri—onye sonyeere ezinụlọ Josef dị ka nwunye ya. Ya mere n'agbanyeghị na Josef abụghị nna mụrụ Jizọs, ya na Meri zụlitere Jizọs—wee n'enye njikọ nke ezinụlọ si na Devid.
Josef kpọọrọ Meri gaa Betlehem, bụ́ obodo Devid. N’ebe ahụ, Meri mụrụ Jizọs, bụ́ ezi Ọkpara Devid. Ma olee ndị bụ ndị mbụ chọpụtara gbasara Ọkpara Devid a mụrụ? Ọ ghaghị ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ.
Akụkọ Ekeresimesi na-echetara anyị na anyị so bụrụ akụkụ nke ihe ka anyị onwe anyị. Kemgbe ụwa, Chineke na ndị mmadụ nọ na-arụkọ ọrụ iji mee ka ụwa dịkwuo ka eluigwe. Devid nwere ọrụ ọ rụrụ na yabụ akụkọ, otú ahụkwa ka Josef mere. Yabụ akụkọ ka na-aga n'ihu, ugbu a ọ bụkwa oge anyị iji mee ọrụ anyị n'ime ya.
Ya mere, olee otú anyị ga-esi gbasoo nzọụkwụ ha? E kwuwe, otu ihe nrụaka dị n'ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị taa. Lee otú Josef si zaghachi òkù Chineke kpọrọ ya. Ị ga-achọpụta na ọ na-ege ntị, na-atụkwasị obi, na-achụkwa àjà nke-onwe iji nyere ndị ọzọ aka. Mgbe anyị na-eme nhọrọ ndị yiri nke ndị a, anyị na-eme ka akụkọ Chineke gaa n'ihu.
Kpee Ekpere: Ezigbo Chineke, daalụ maka ịkpọ anyị òkù isoro n’akụkọ Gị. Ama m na enwere m okè ọrụ m ga-arụ ije mee ka ụwa dịkwuo ka eluigwe. Ya mere, biko nyere m aka ịma otú Ị si akpọ m ka m mee mgbanwe dị nma na ndụ ndị ọzọ. N'aha Jizọs, amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.
More