Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Akụkọ EkeresimesiIhe Atụ

The Christmas Story

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Gịnị Mere M Ji Bụrụ Onye E Nyere Ngozi Amara Nke Ukwuu?

Akụkọ Ekeresimesi bụ ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ dịtụla gị mgbe ọ dị gị ka ị baghị uru, ị rughị eru, ma ọ bụ na gị bụ onye e leghara anya. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi na ụdị mmadụ ndị a bụ ndị bụ isi na Akụkọ Ekeresimesi.

Nwa obere oge, chefuo ihe niile ị ma gbasara Akụkọ Ekeresimesi. Ị meela nke ahụ? Ọ dị mma, were ya na ị chọpụtara na Chineke na-achọ ịbịa n’ụwa, na ị makwa na a ga-amụ ya n’ime ezinụlọ mmadụ. Olee ụdị ndị ị chere na Chineke ga-ahọrọ ịbụ nne na nna Ya?

Eleghị anya, ị ga-eche na Chineke ga-ahọrọ ezinụlọ ndị okpukpe ha siri ike, ọ̀ bụghị eziokwu? Ma ọ bụrụ na ọ bụghị ha, eleghị anya, Chineke ga-ahọrọ di na nwunye nwere akụ n'ụba ahụrụ anya, nkà pụrụ iche, na ọtụtụ ihe ọrụ ime mmụọ gasị ha mezuru.

Ma cheta, na Akụkọ Ekeresimesi jupụtara na ihe ịtụnanya. Ya kpatara na Chineke ahọrọghị di na nwunye bara ọgaranya ma dị ike. Kama, Ọ họọrọ otu n'ime ndị ikpeazụ ị ga-atụ anya ya maka ụdị ihe a.

Meri bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di, bi n'obere obodo. O nweghị ike ọbụla, nke ọ ji enwe ihe ọbụla bara uru ejiri mara ya. Ọ bụ mmadụ dị nkịtị, ma Chineke họọrọ ya ime ihe pụrụ iche.

Onye mmụọ ozi si na Chineke gwara Meri na ọ dị ime nke Onye Nzọpụta ahụ e kwere nkwa ya, n'agbanyeghị na ọ bụ nwaanyị n'amaghị nwoke. Taa, anyị ga-agụ otú Meri si meghachi omume n’ịchọpụta ọrụ dị ịtụnanya ọ rụrụ n’akụkọ Chineke. Nye Meri, ozi ahụ bụ ihe ịrịba ama na Chineke na-ahụ ma na-eche banyere ndị dị ka ya. Na Onye-nzọpụta a ga-ebuli elu ndị ụwa na-ewere dị ka ndị na-abaghị uru.

Akụkọ Ekeresimesi n'ajụ echiche nke bụ na ọ dị mkpa ka ị nwee akụnụba, ihe bara uru eji mara gị, ma ọ bụ ihe nkwụwa okwu dị ike iji mee mgbanwe. Ndị na-abaghị uru, ndị dị nkịtị, na ndị na-erughị eru dị mkpa n'anya Chineke. Ya mere Ọ na-ahọrọ ka Ya na ha rụkorita ọrụ iji gosi ụwa na Ọ na-eche banyere onye ọ bụla.

Oge ọzọ ọ dị gị ka ị nweghị uru ma ọ bụ na i rughị eru, cheta Akụkọ Ekeresimesi. Ọ bụ ihe ncheta siri ike na uru anyị bara sitere na Chineke, Onye na-ahụ anyị ka anyị dị, hụ anyị n’anya, ma chọọ ka anyị na Ya rụkorita ọrụ ịkpọ ndị ọzọ òkù ka ha bata n’ime ezi-na-ụlọ nke Ya.

Kpee Ekpere: Ezigbo Chineke, a dị m ekele maka ịhụnanya Gị. Nyere m aka ịgbadebe uru onwe m na otú ị sị hụ m n'anya nke ukwuu, n'abụghị otu onye ọbụla si chee. Biko duzie m ka m bịarute nso ndị mmadụ n'agabịga ihe mwute, bụ ndị mmadụ n'eche na ọ nweghị uru ọbụla ha bara, ka m wee lekọta ha otu Ị sị wee meere m. N’aha Jizọs, amen.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Christmas Story

Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka ịnye Atụmatụ Ihe Ọgụgụ a. Maka ozi ndi ozi, biko gaa na www.life.church