Chineke na-ahụ gịIhe Atụ
Ọrụ Nna
Alaeze ọ bụla nke a na-asọpụrụ ma na-akwanyere ugwu n'etiti ụmụ mmadụ bụ alaeze nke ụmụ amaala ya mụtara i buru ibu ọrụ nke ichebe iguzosi ike n'ezi ihe nke alaeze ahụ.
Alaeze nke nchebe nguzosi ike n’ezi ihe ya bụ ihe nke a hapụrụ n’aka mmadụ ole na ole bụ alaeze nke iguzosi ike n'ezi ihe ga-ata ahụhụ.
Nwa amaala ọ bụla nwere ibu ọrụ ichebe ọdịmma nke alaeze ha.
Jizọs matara ihe a nke ọma. Mgbe ọ nọ n'ụwa, ọ maara nke ọma na ọrụ Nna ya bụ ọrụ ya.
N’ebe ọ gbasara Jizọs, ọrụ Nna ya n'ụwa bụ ihe gara nke ọma n'ihi na onye nnọchi anya nke Nna (bụ Jizọs) weere ọrụ Nna ya dị ka ọrụ nke onwe ya.
Okwu ọnụ Jizọs na Jọn 9: 4 na-egosi nkwa miri emi nke ya maka ịkwalite na ichebe ọrụ Nna ya.
Ị̀ na-ewere alaeze Nna dị ka nke gị?
Ị̀ na-eji oge gị eme ihe ndị na-akwalite ma na-echebekwa ọdịmma nke alaeze ahụ?
Prayer: Ezi Nna m, ekpere m bụ ka ị kụziere m obi a iwere ọrụ gị dị ka nke m. Nye m amara iji oge m were mee ọrụ ndị na-akwalite ma na-echebe ọdịmma nke alaeze gi.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Jọn 9:1-5: Chineke n'okwu Jizọs na-adụ anyị ndụmọdụ ka anyị jiri ngwa ngwa na-emeso ọrụ ya n'ihi na, abalị na-abịa.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d