Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke na-ahụ gịIhe Atụ

Chineke na-ahụ gị

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Mma N’ọnọdụ Ntụ

Gịnị mere ihe ọjọọ ji adakwasị ezigbo mmadụ?

Nke a bụ ajụjụ ọtụtụ ndị kwere ekwe na-ajụ oge ọ bụla ọnọdụ na-adịghị mma na-adakwasị nwa Chineke.

Cheta na Jọn 9:3 bụ nzaghachi Jizọs nye ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya banyere onye kpatara ihe mere na nwoke ahụ kpuru ìsì kemgbe a mụrụ ya.

Azịza Jizọs dị nnọọ omimi. N’azịza ya, Ọ nọ na-enyere ndị na-eso ụzọ ya na onye nke Kraịst ọ bụla ọzọ aka ịgbanwe uche anyị site na isi iyi nke nhụjuanya ma tinye uche anyị n’ihe bụ nzube ya.

Site n’azịza Jizọs, anyị chọpụtara na, ìsì nwoke a abụghị ntaramahụhụ maka mmehie ya ma ọ bụ nke nne na nna ya. Kama, ọ bụ ohere Chineke ga-eji rụọ arụ ọrụ na ndụ ya.

N'ihe ịma aka na mgba anyị, kama ịjụ Onyenwe anyị, gịnị mere nke a ji eme m, kedụ ihe ọjọọ m mere? Jụọ sị, “Onyenwe m, olee otú ị ga- esi gosi m ọrụ gị site n' ihe ịma aka a?”

Dịka Jizọs gwọrọ nwoke ahụ kpuru ìsì ma wepụta ihe ọma n'ọnọdụ jọgburu onwe ya, Jizọs ga-egosipụta ike ya n'ime gị ma site n'aka gị, Ọ ga-eme ka ìhè Ya nwuo n'ọchịchịrị.

Prayer: Ezigbo Onyenwe m, a na m ekpe ekpere maka amara na ndidi, ka m wee chere ruo mgbe m ga-ahụ ka ìhè gị na-enwu ọbụna n'etiti ọnwụnwa.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke na-ahụ gị

Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Jọn 9:1-5: Chineke n'okwu Jizọs na-adụ anyị ndụmọdụ ka anyị jiri ngwa ngwa na-emeso ọrụ ya n'ihi na, abalị na-abịa.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d