Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke na-ahụ gịIhe Atụ

Chineke na-ahụ gị

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Chineke na-ahụ gị

Jizọs zutere otu nwoke nke na-amaghị ihe bụ onyinye nke iji anya wee hụ ụzọ.

Amaokwu Baịbụl a na-arụtụ aka n'ihe miri emi, ọ karịrị ìsì anụ ahụ́.

Ọ bụ ihe ngosi ọnọdụ ime mmụọ anyị tupu anyị ezute Jizọs. A mụrụ anyị niile na ìsì ime mmụọ, anyị enweghị ike ịhụ eziokwu nke ịhụnanya na amara Chineke.

Mana Jizọs na-ahụ anyị, dịka ọ hụrụ nwoke ahụ kpuru ìsì. Ọ na-ahụ mkpa anyị miri emi na mgba anyị kachasị ukwuu. Ọ dịkwa njikere mgbe niile izute anyị ebe anyị nọ, iji weta ìhè n’ọchịchịrị anyị.

Dika anyị na-atụgharị uche n'amaokwu a, ka anyị jụọ onwe anyị:

Ebee ka m kpuru ìsì n'ụzọ ime mmụọ?

Ebee ka m chọrọ ka Jizọs wetara m ìhè na nghọta?

Prayer: Ana m ekele gi Chineke Nna maka okwu gị taa. Ana m ekele gị nke ukwuu maka ncheta a bịara n’oge: n'agbanyeghị ihe ọ bụla chere m ihu, nyere m aka icheta mgbe niile, n’ị na-ahụ m. Nyere obi m aka ịchọta ike na nkasi obi mgbe niile n'eziokwu nke bụ na ị maara onye m bụ ma na-ahụkwa m.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke na-ahụ gị

Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Jọn 9:1-5: Chineke n'okwu Jizọs na-adụ anyị ndụmọdụ ka anyị jiri ngwa ngwa na-emeso ọrụ ya n'ihi na, abalị na-abịa.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d