Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke na-ahụ gịIhe Atụ

Chineke na-ahụ gị

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Echiche Nke Na-adabaghị

Mgbe ọnọdụ na-adịghị mma na-eche anyị bụ ndị kwere ekwe ihu, otutu n'ime anyị, mgbe niile, na-eme ngwa ngwa iche na, "Ọ bụ mgbe niile ka ahụhụ na-abụ nsonaazụ mmehie."

Ajụjụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kpughere ụdị echiche a.

Ma na, n'ime nzaghachi Jizọs nyere ha, anyị nwere ike ịhụ ihe na-akpali mmasị nke ukwuu. Ọ na-egosi na nhụjuanya nwere ike inwe nzube nke ka ukwuu, nke karịrị ntaramahụhụ ma ọ bụ ụta.

Anyị na-ajụkarị otu ajụjụ ndị ahụ dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ, na-achọgasị ikenye ụta ma ọ bụ chọta ihe kpatara mgba mgba na ndọli anyị na ndị ọzọ.

Kedụ kwanụ maka anyị jụọ sị: 'Onyenwe anyị, olee otú ị ga-esi jiri ihe nke a mee ihe maka otuto gị?' ma ọ bụ 'Olee otú m ga-esi tụkwasị gị obi n'ọnwụnwa a?'

Ka anyị mụta ịhụ mgba anyị dị ka ohere Chineke ga-eji wee rụọ ọrụ n'ime ndụ anyi ma site n'aka anyị. Anyị agaghị ahụ mgba anyị dịka ihe bịara n'ihi mmehie ma ọ bụ ọdịda anyị. Ka anyị tụkwasị Chineke obi ma kwenyere na ọ na-arụ ọrụ mgbe niile maka ọdịmma anyị, ọbụna n'oge kachasị ọchịchịrị.

Prayer:

Ezi nna m, nyere m aka ịhụ mgba m niile dị ka ohere Ị ga-eji wee rụọ ọrụ n'ime m ma site n'aka m.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke na-ahụ gị

Echiche Akwụkwọ Nsọ maka Jọn 9:1-5: Chineke n'okwu Jizọs na-adụ anyị ndụmọdụ ka anyị jiri ngwa ngwa na-emeso ọrụ ya n'ihi na, abalị na-abịa.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Annie Fortunate maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/profile.php?id=100079911486748&mibextid=LQQJ4d