Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Onyinye nke EkeresimesiIhe Atụ

The Gift of Christmas

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Ọnụnọ Ya Na Eme Mgbanwe

N'akụkụ niile nke e gosiri n'akụkọ nke Ekeresimesi, o nwere ike ịbụ na akụkụ kacha dị ala bụ ebe a mụrụ Jizọs. Ekeresimesi mbụ ahụ ji njem-okporo ụzọ malite. Josef na Meri si na Nazaret jee Betlehem mgbe Meri dị ime Jizọs. Meri eruwo nso oge ọ ji amụ nwa ka ha n'aga njem ahụ. Ka ha bịarutere Betlehem, ime malitere mewe Meri. Mana n'ụzọ dị mwute, nnukwu nsogbu dapụtara. Obodo ahụ jupụtara na mmadu, enweghịkwanu ohere maka ha n'ụlọ ezumike dị adị maka ndị njem bịara n'obodo ahụ.

Naanị ohere dịnụ bụ ụlọ anụmanụ. Nke a nwere ike ịbụ ụlọ na amaghị mma ma ọlị ebe ana edebe ụmụ anụmanụ ka ha lakpuo n'abalị. Ọ dịghị enye nnukwu nchebe maka ihe ọbụla, ọ dịghịkwanu oké uru a hụrụ anya ọ bara. Ọ ga-abụ na o sigburù onwe ya n'isi nke ụmụ anụmanụ na nri ha. Ọ dịghị ọcha, ọ dịghị mma ile anya, wee dị nnọọ ka ebe ana ekwesịghị ekwesị ma ọlị ịmụ nwa. Mana ọ bụ ebe nwere ohere, ọ bụkwanụ ebe e nyere Josef na nwunye ya Meri ime n'eme.

Nke a bụ ebe a mụrụ Jizọs. Ihe ndina nke mbụ Ya bụ ihe eji enye ụmụ anụmanụ nri, n'ụlọ ụmụ anụmanụ na-arahụ. A mụrụ Jizọs n'ọnọdụ dị ala karịsịa. Isí na enweghị ihe mara mma n'ebe a mụrụ Ya bụ ikwu ya n'ụzọ na-agaghị akpali oké mwute.

Ndị mmụọ ozi nwere nnukwu ozi dịịrị ha ikwusa, dịka ndị Mejai ahụ na kpakpando ahụ ha sorolà. Ụlọ anụmanụ ahụ, e kwuwe, nwere ozi pụrụ iche ọ na-ekesa nye mmadụ ọbụla dịnụ ma ọ bụ nke gaje ịdị n'elu ụwa. Ụlọ anụmanụ ahụ n'egosi otú Jizọs si dị njikere ịbata n'ohere ọbụla dị adị, nke e nyere Ya, na ọnọdụ ọbụla. Ọ bụghị iwu na ohere a ga-ama oké mma ma ọ bụ dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụghị iwu na ọ ga-adị nkwanye ùgwù. Ọ bụghị iwu na ọ ga-adị ọcha. Ọnụnọ Jizọs ga-eme ka yabụ ebe dị ọcha na nwee nkwanye ùgwù.

Ụlọ ahụ ana enye ụmụ anụmanụ nri ghọrọ obí eze, ihe ahụ eji enye ụmụ anụmanụ nri ghọrọ ocheeze. Otù ha dị agbanweghị, mana ọnụnọ Ya bụ ọdịiche dịnụ banyere ha. Jizọs dị njikere ịbịa biri n'ime obi nke mmadụ ọbụla dị ogheré ịnabata Ya na nke e nyefere Ya. Ebe ọbụla Ọ batara ma ọ bụ were ọnọdụ, Ọ na-agbanwe ebe ahụ. Eziokwu a bụ ozi nke Ekeresimesi.

Ka ị n'agba Ekeresimesi afọ a, gbaa mbọ hụ na akụkụ niile nke ndụ gị dị oghere nye Jizọs ma nyefee ihe gị niile n'aka Onye gaje ịbịa wee gbanwee ndụ gị maka ebube Ya.

Nweeré onwe gị Ụtọ Nke Ekeresimesi, ka ọtụtụ ngọzi dirí gị n'afọ na-abịa abịa.

Ọ bụrụ na atụmatụ ihe ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ mgbe ị n'agụ ya, anyị na-akpọ gị òkù ka ị jikọọ na ILI iji chọpụta ka ị ga-esi too ka onye ndú ma mee ka nkwusa Oziọma bawanye. Maka ozi ndị ọzọ, gaa na https://iliteam.org/connect.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Gift of Christmas

Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://iliteam.org