Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Onyinye nke EkeresimesiIhe Atụ

The Gift of Christmas

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

Ọnụnọ Nke Kpakpando Ahụ

Akwụkwọ Nsọ n'ekwu na eluigwe na ụwa n'ekwupụta ebube nke Chineke. Ọ bụ uche m na ọtụtụ ndị kwere ekwe kwenyere na nke a. N'agbanyeghị nke a, o nwere ihe gbasara ihe niile e kere eke n'eme ka onye ọ bụla hụrụ ha si, "IHE NKE A AMAGBUO ONWE YA!"

Nye ụfọdụ, o nwere ike ịbụ oké ugwu ha si n'ebe dị anya wee n'ekiri. Nye ndị ọzọ, ya abụrụ anụnụ anụnụ nke ebili mmiri n'atụgharí na oké osimiri ma ọ bụ agba ndị jupụtara n'ụmụ osisi ka a n'achọ ịba oge ọkọchị. Mana, nye ọtụtụ ndị, ọ bụ ịma mma nke ìgwè kpakpando jupụtara na mbara igwe abalị. Ọkụ ndị ahụ ana-apụghị ịgụ ọnụ n'egbuke egbuke bụ ndị a pụrụ ịhụ site n'ebe dị anya. Nha ha, okpomọkụ ha, na ọnụ ọgụgụ ha abụghị nke a pụrụ ichetu n'echiche.

E nwere otu kpakpando dị iche n'ebe ndị ọzọ dị. Ọ bụ kpakpando ahụ durulà ndị Mejai ahụ dugaa n'ebe Jizọs nọ. Akụkọ banyere kpakpando a pụrụ nnọọ iche. Ọ malitere na ndị nwoke ana akpọ Mejai. Ha bụ ndị "sitere n'ebe ọwụwa anyanwụ," nwere ike ịbụ Peshia. A ma ndị nwoke a dịka ndị eze na ndị amamihe, aha ahụ akpọrọ ha bụ Mejai gosikwarà na nke a bụ eziokwu. Ha bụ ndị nwoke ọkà mmụta ndị rigooro oké ọkwa n'ọchịchị n'ihi amamihe ha dị ukwuu.

Ndị Mejai a hụrụ kpakpando dị ọhụrụ na dị iche na mbara-igwe nke abalị ha. O nwere ihe dị nnọọ iche gbasara kpakpando a, o wee bụrụ uche ha na kpakpando a pụtara igosi ọbịbịa nke eze ukwuu. Ha wee kpebie isoro kpakpando a n'ihi na ọ bụ uche ha na ọ ga-eduga ha n'ebe eze ukwuu a nọ.

Kpakpando a mechara dugaa ha n'ebe Jizọs a mụrụ ọhụrụ nọ, ndị Mejai ahụ ewee kpọọ isi n'ala nye Ya ma nye Ya onyinye dị iche iche. Eji n'aka na ọ dịghị ihe pụrụ ịkpali mmasị ha hụrụ na Meri, Josef, Jizọs, ma ọ bụ na gburugburu ha. Ọ dịghị ihe gosiri na ha nọ n'ihu eze. Ocheeze anọghị, ma ọ bụ uwe eze, obi eze, ma ọ bụ ndị odibo eze.

Ha bụ ezinụlọ n'enweghị ka ọ dị ha nọ ebe n'adịghị mma. N'agbanyeghị nke ahụ, ndị Mejai ahụ akpụghị ukwu n'ala ịsọpụrụ Jizọs a mụrụ ọhụrụ ka Eze tosiri inara nkwanye ùgwù ha. Ha kpọrọ isi ala nye Ya, ma nye Ya onyinye gasị dị oké ọnụ. Ihe ndị a niile bụ n'ihi na ha hụrụ kpakpando ahụ.

Kpakpando ahụ bụ isi iyi nduzi nye ndị Mejai ahụ. Ọ bụ "ìhè, na-enwu n'ọchịchịrị." Ọ bụghị naanị na ọ pụtara ìhè n'ọchịchịrị mbara-igwe nke abalị, ọ bụkwa ìhè nke mkpughe gosiri eziokwu nke onye Jizọs bụ, na Onye Ọ ga-anọgide na-abụ. Jizọs bụ Eze ahụ ndị eze niile n'abịa n'ihu Ya wee n'akpọ isiala enye. Ụfọdụ ga ejiri obi ha niile mee ya, n'ihi na ha n'ekwenye na ha amatala Onye Ọ bụ, ebe ndị ọzọ ga-eme ya n'okpuru mbigide aka ike Ya ka ha kwụ n'ihu ocheeze ikpe Ya, otu ụbọchị.

Ọbụna taa, kpakpando ahụ ka na-agwa anyị okwu. Ọ bụ ihe ncheta na anyị nwere ọnụnọ nọnyeere anyị nke n'eduzi anyị ma n'ekpughere anyị eziokwu nke Chineke. Ọnụnọ a abụghịzi kpakpando dị n'eluigwe, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ e nyere ka Ọ bịa biri n'ime anyị. Ọ bụ “Mmụọ nke Eziokwu, na-eduzi anyị baa n'ime eziokwu niile." Ọ bụ "Onye Ndụmọdụ," anyị nọ ya oge niile ime ka ìhè bata n'ime uche anyị na mmụọ anyị. Ọ bụ Ya n'amuke ụzọ anyị ka anyị nwee ike ije ije awele.

Dika kpakpando ahụ bụ ọnụnọ pụrụ iche nye ndị Mejai ahụ, n'eduzi nzọm ụkwụ ha niile, otu ahụ ka Mmụọ Nsọ n'Onwe Ya si eduzi anyị ụbọchị taa. Ilu 3: 5-6 kwuru ya n'ụzọ mara mma, "Tụkwasị obi gị na Chineke ma adaberelà na nghọta nke gị, kama chee ụzọ gị niile n'ihu Ya dịka Eze gị, Ọ ga-eduzi ha niile."

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Gift of Christmas

Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://iliteam.org