Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Onyinye nke EkeresimesiIhe Atụ

The Gift of Christmas

ỤBỌCHỊ 3 NKE 4

Ọnụnọ Nke Onye Nzọpụta

Ekeresimesi n'abụ́ nnọọ oge mara mma n'ihi nnọkọ anyị na ezinụlọ anyị n'enwe, ihe ndị n'enye obi ụtọ anyị na ezinụlọ anyị n'emekari n'oge ezumike, nri gasị dị ụtọ anyị n'eri, ngbakọ na ememe gasị pụrụ iche anyị na-aga, ihe eji achọ mma juru ebe niile, na obi aṅụrị anyị n'enwe n'inata na inye ibe anyị onyinye. Mana Ekeresimesi bụ naanị maka otu ihe, ma ọ bụ ikwu ya n'ụzọ doro anya, otu Onye.

Ekeresimesi bụ Ekeresimesi... n'ihi Jizọs. Ememe niile a n'eme na Ekeresimesi bụ maka ihe a hụrụ anya bụ́ na Chineke bịara n'ụwa n'ụdị anụ ahụ nke mmadụ. Otu n'ime aha ndị Jizọs nwere bụ Immanuel, nke pụtara "Chineke nọnyeere anyị." Tụgharịa uche na nke ahụ nwa oge. Chineke abịawo ịnọnyere anyị. Chineke hụrụ anyị n'anya nke ukwuu nke na Ọ bịara bịa nọnyere anyị, ọ bụ ya kpatara anyị ji eme ememe Ekeresimesi.

Oziọma Jọn ji okwu dị otú a malite, "Na mbido ka Okwu Ahụ dị, Okwu ahụ na Chineke dịkọtarà, Okwu Ahụ bụkwa Chineke." Ka a gụchara amaokwu ole na ole sochirinụ, okwu a bụ nke e mere ka ọ mụbaa site na nkwupụta ahụ bụ, "Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ, wee bịa biri n'etiti anyị." "Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ" n'ekwu gbam gbasara Ekeresimesi. Ọ n'ekwu banyere Jizọs.

Immanuel, "Chineke nọnyeere anyị!"

Chineke ghọrọ anụ ahụ wee bịa biri n'etiti anyị n'akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Chineke tara ahụhụ nke nsogbu niile mmadụ na-agabiga, nweté ọnwụnwa niile na-abịa n'ụzọ anyị, mana Ọ dabaghị na njọ ma ọ bụ mee mmehie. O nwere ahụmahụ nke mmetụta-uche anyị oge O bere ákwá maka Jeruselem na Lazarọs, enyi Ya. Ọ gabigara ezigbo ntaramahụhụ nke uche, obi na ahụ n'ogige Getsemeni na nhụjuanya nke anụ ahụ Ya n'oge a nọ na-emekpa Ya ahụ tupu a kpọọ Ya n'obe. Ọ́ bụghị́ ezigbó ihe ịtụnanya na Chineke abịaghị naanị ịnọnyere anyị kama Ọ bịakwara inwe ahụmahụ zuru okè nke adịghị-ike anyị niile dị ka ụmụ mmadụ.

Nke a pụtarà na ọ dịghị oge ọ bụla, ọ dịghị ọnọdụ ọbụla, ọ dịghị mgbe ọbụla, Chineke anọnyereghị anyị. Ọ bụghị "Ọ dị otu mgbe Chineke nọnyeere anyị," kama Ọ bụ "Chineke nọnyeere anyị."

Mgbe Jizọs laghachiri n'eluigwe, Mmụọ Nsọ bịara bịa biri n'ime anyị. Chineke abịawo bịa biri n'ụdị anụ ahụ nke mmadụ site na Jizọs ịdị otu ahụ, Chineke abịawokwa bịa biri n'ime anyị site na Mmụọ Nsọ.

“Ọṅụ dịrị Ụwa, Onye-nwe-anyị abịawo!”

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Gift of Christmas

Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://iliteam.org