Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Onyinye nke EkeresimesiIhe Atụ

The Gift of Christmas

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

Ọnụnọ Nke Ndị Mmụọ Ozi


Ndị mmụọ ozi bụ ndị ama ama n'akụkọ Ekeresimesi. Ha n'apụta gosi onwe ha ọtụtụ oge ma nwee ọrụ dị oke mkpa mgbe niile n'ọnọdụ ha bịara maka ya. A maara ha dị ka "mmụọ ije ozi" na "ndị ozi nke Chineke," ma ha rụrụ ọrụ dị ezigbo mkpa na akụkọ nke ọmụmụ Jizọs.

N'akụkọ Ekeresimesi, ọrụ ama na ha rụrụ nke ọma bụ ọrụ "ndị ogbu-opì." Ọrụ ha bụ ikọsà ma ọ bụ ikesà ihe dị mkpa. Ha mere nke a oge kwa oge n'akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs.

Oge mbụ ha mere nke a bụ mgbe mmụọ ozi bịakwutere Zakaraya, n'agwa ya na nwunye ya, Elizabet, ga-amụ nwa ga-abụ onye-nchụzọ̀ Mezaya ahụ. N'oge na-adịghị anya, otu mmụọ ozi bịakwutere Meri wee gwa ya na n'agbanyeghị na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ ga-amụ Jizọs, Ọkpara Chineke.

Oge ọzọ bụ mgbe Josef chọpụtara na Meri dị ime; nke ahụ gbagwojuru ya anya, obi tiwara ya, ọ wee na-akpụ n'obi ya otú ọ ga-esi jiri nwayọọ bibie mmekọrịta ya na Meri n'ụzọ dị mma karịsịa. N'ikpeazụ, mmụọ ozi bịara nye Josef ozi ọma na ime ahụ Meri dị bụ nke ọrụ ebube na nwata ahụ ọ ga-amụ bụ Chineke bịara n'anụ ahụ nke mmadụ. Mmụọ ozi ahụ gakwara n'ihu wee kpughee na nwa ahụ ga-abụ Onye Nzọpụta nke ụwa.

E nwekwara akụkọ nke ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ nọ n'elekọta atụrụ ha n'oge abalị. Ọzọkwa, otu mmụọ ozi bịara bịa nye ha "ozi ọma nke oké ọṅụ." N'ebe a, "ọtụtụ ndị mmụọ ozi nke ìgwè eluigwe” bịara soro otu mmụọ ozi a kwusaa ozi ya.

N'ikpeazụ, otu mmụọ ozi dọrọ Josef aka ná ntị ka ọ kpọrọ Meri na Jizọs “gbagaa Ijipt” n'ihi na Herọd nọ n'achọ Jizọs ka o gbuo Ya. N'akụkọ niile nke Ekeresimesi n'ime Akwụkwọ Nsọ, ndị mmụọ ozi bịara, ha kwuru ozi dị mkpa sitere n'aka Chineke, ozi ha lekwasịkwarà anya na Jizọs.

Ndị mmụọ ozi ka dị, ha ka na-arụ ọrụ ha, mana anyị bụ ndị e nyere nnukwu ihe ùgwù na ibú ọrụ nke ikwusà "Ọzi Ọma" ahụ taa. Anyị bụ ndị e nyefere ọrụ ahụ nke ịgwa ndị ọzọ maka ozi nke ịhụnanya Chineke, a n'ahụ anya n'ime Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ekeresimesi bụ oge dị ezigbo mma ikwusà ozi ahụ mara mma bụ Ozi Ọma. E nyela anyị iwu ka anyị baa n'ụwa wee na-agwa ndị ụwa maka ozi ahụ mara mma bụ nke olileanya na nke nzọpụta dị na Jizọs Kraịst.

Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi bụ ndị bú ụzọ zie ozi ọma na Ekeresimesi nke mbụ, mana ugbu a ọ bụzì anyị ka ọ dịịrị.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Gift of Christmas

Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://iliteam.org