Ihe Kpatara Ejiri Mụọ JizọsIhe Nhụchatụ

Ihe Kpatara Jizọs Jiri Bịa
Kraịst Jizọs batarà n'ụwa iji zọpụta ndị mmehie. (1 Timoti 1:15)
Akwụkwọ-ozi ndị ahụ edegaarà Timoti na Taịtọs ka a na-akpọ "Akwụkwọ-Ozi Maka Ndị Ụkọchukwu" n'ihi na Pọl dere akwụkwọ ozi ndị a nye ndị nwoke a n'ọrụ ha dịka pastọ na Efesọs na na Aịlandị nke Krit. Timoti na Taịtọs nọchiri anya ọgbọ nke abụọ nke ndị n'ezi oziọma, ma ka Pọl kwadebere itinye ọrụ nzisa Oziọma n'aka ha, o nyere ha okwu agbamume.
N'oge Pọl dere akwụkwọ ozi ikpeazụ ndị a, ọtụtụ "okwu ndị ekwesịrị ịtụkwasị obi" amalitela wee n'agbasa n'etiti ndị ụka mbụ. Ebe ọ bụ na onweghị onye nwere Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ihe ọ bụla edere, ndị mmadụ buuru n'uche okwu ole na ole chịkọtará nkụzi gbasara Oziọma. N'Edide atọ ndị ahụ e degaarà Ndị Ụkọchukwu, Pọl rụtụrụ̀ aka n'ụfọdụ okwu ndị ahụ na-agagharị wee nye ha mbinye aka ee site n'ikike ya ịbụ Onye-Ozi Kraịst. N'akụkụ mbụ nke 1 Timoti, Pọl kwuru maka otu n'ime okwu ndị ahụ ama ama, sị: "Kraịst Jizọs bịara n'ụwa ịzọpụta ndị mmehie."
Ka anyị tụgharịa uche ime maka okwu ndị a ma n'ahụ ha ka ihe dị mkpa nke Oziọma. Ka anyị sì jupụta na mmehie abụghị ihe n'agbatakarí anyị n'obi n'oge Ekeresimesi. Anyị n'achọ idebe ihe niile ka ha bụrụ nke obi ọma ma n'egbuke egbuke. Mana ọ bụ̀ mmehie kpatara ka a mụọ Jizọs na Betlehem. A mụrụ Jizọs ka O sí na mmehie ahụ niile zọpụta anyị. Nke ahụ bụ kpam kpam ihe Ekeresimesi bụ maka ya.
Ụfọdụ n'ime anyị maara ekpere ahụ bụ "Ekpere Jizọs" wee n'ekpe ya kwa mgbe. Ekpere ahụ dị mfe ikpe, ọ bụ: "Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke, meere m ebere, mụ bụ onye mmehie." Anyị maara na ụdị obi ebere ahụ dị adị. N'ihi na "Kraịst Jizọs batarà n'ụwa iji zọpụta ndị mmehie."
******
Ihe òfùfè ndị a so bụrụ akụkụ nke ihe òfùfè Words of Hope banyere ihe usoro Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ana agụ n'ọnwa. Iji gụkwuo ihe ndị ọzọ, debanye aha gị na ihe òfùfè Words of Hope ụbọchị taa !
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.
More