Ihe Kpatara Ejiri Mụọ JizọsIhe Atụ
Nà Enwu Enwú
Ìhè nà-enwu n'ọchịchịrị. (Jọn 1:5)
Anyị hụrụ n'ihe anyị gụchara otu Mak siri nye anyị nkọwa banyere "Mmalite nke Oziọma." Taa Jọn n'akpọrọ anyị gaa na mmalite bú mmalite niile ụzọ site n'iji okwu nke yiri nke Jenesis bido: "Na mbido." Ọ bụ ezie na oziọma Jọn enweghị akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs, mana o nyere anyị nkọwa pụrụ iche banyere ọmụmụ ahụ site n'ime ka otú anyị si ahụ ihe bawanye ka nke Kosmos.
Jọn n'ekwu maka "Okwu" Chineke ahụ. Na Grik a na-akpọ ya Logos. Logos nye ndị Grik bụ ụkpụrụ kacha ihe niile maka nhazi. N'ebe a, Jọn ji okwu ahụ n'ụdị echiche ahụ gosi anyị ihe, mana o metụrụ ya obere ngbanwe. Logos bụ́ ezie abụghị ike dị na Kosmos ana amaghị maka ya. Ọ bụ Ọkpara Chineke nke mechara bịa n'anụ ahụ dịka Jizọs onye Nazaret.
Mgbe na Jenesis 1 anyị na-agụ "Ka ìhè dị. . . Ka ụwa puó ahịhịa na akwụkwọ ndụ. . . Ka ihe a kpọrọ mmiri jupụta na ihe na anụ-ndụ na ka ha n'achigharikwá n'ime mmiri ndị a. . . " Ọ bụ Ọkpara Chineke nọ n'ekwu ihe ndị a. Nna, Nwa, na Mmụọ Nsọ tinyekọtarà aka wee kee eluigwe na ụwa, mana Logos—bụ Okwu—nke Chineke bụ̀ Ya nọ n'enye iwu.
Ọ bụ̀ Ya bụ ndụ Kosmos dum. Ọ bụ Ya bụ Ìhè nke n'enwu. Na nkọwa ya Oziọma Nke Jọn, Frederick Dale Bruner kwụsiri ike otù okwu ahụ kà si bụrụ ihe n'eme eme: Ìhè ahụ kà n'enwu. Nke a bụ nke ga-aga n'ihu n'eme. O nwekataghị kwụsị. Ọchịchịrị nke ihe ọjọọ enwekataghị mee ka ọnyuo. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị ka ọchịchịrị nke ụwa a ọ kariri akarí. Mana Oziọma Jọn na-agwa anyị na ọ pụghị ma ọlị imeri Ìhè ahụ bụ Jizọs!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.
More