Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Kpatara Ejiri Mụọ JizọsIhe Atụ

Why Jesus Was Born

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Mmalite

Mmalite nke oziọma nke Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke. (Mak 1:1)

Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa bụ mmalite ọhụrụ. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa bụ mmalite ọhụụ maka ihe niile dị adị n'eluigwe na ụwa. Taa, Mak na-akpọrọ anyị bịa na mmalite a. Amaokwu mbụ ahụ jupụtara n'ọtụtụ ihe. N'ụzọ ike ahụ o si ekwu okwu—Mak abụghị onye n'ekwu ọtụtụ okwu—Mak na-agwa anyị na nke a bụ mmalite ozi ọma, nke ozizi okwu Chineke. Mgbe o mechara nke a ọ nyere nkọwa maka nwoke si Nazaret a na-akpọ Jizọs wee gwa anyị ozugbo na nwoke a bụ Kraịst, Mezaya ahụ e kwere nkwa ya kemgbe oge ochie. E wee gwakwa anyị na, nwoke a bụ Ọkpara Chineke. Ítụpịasị okwu ndị a dị ole na ole nwere ike iwe mmadụ oge ndụ ya niile.

O nweghị onye maara nke ọma ka “mmalite” a si dị ogologo na Mak. Mmalite a ọ bụ̀ naanị isi akwụkwọ a nke mbụ? Ọ̀ bụ̀ akụkụ nke isi akwụkwọ nke mbụ a? Ma ọ bụ̀ o nwere ike ịbụ na Akwụkwọ dum nke Mak bụ mmalite n'onwe ya? Otu o sila dị, anyị na-amalite site na nkwupụta ahụ bụ́ hoo haa na Jizọs bụ̀ Onye Chineke họọrọ na Kraịst Ya e tere mmanụ. Jizọs bụ Onye ahụ! Mana ebe ọ bụ Ọkpara Chineke, anyị n'ekwenye na Onye ahụ so bụrụ Chi n'ime Atọ n’Ime Otu, bụ́ Onye a mụrụ dị ka mmadụ, a kpọrọ Jizọs, a dịgó adị kemgbe ebighị ebi.

Nke a bụkwa ozi ọma n'ihi na ọ na-agwa anyị na Onyé ahụ́ batará n'ụwa n'abalị ahụ jupụtara na kpakpando, na Betlehem, nwerè ike ahụ dị mkpa iji zọpụta anyị na mmehie anyị. Ịdị mgbapụta bụ njedebe nke akụkọ onye ọbụla n'ime anyị. Mana nke a na-amalite site na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke!

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Why Jesus Was Born

Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Words of Hope maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://woh.org/youversion