Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Kpatara Ejiri Mụọ JizọsIhe Atụ

Why Jesus Was Born

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Ọmụmụ̀ Ahụ

O wee mụọ nwa ya nwoke mbụ. (Luk 2:7)

Onye ọbụla bụrụla Onye Kraịst nwa oge, ga-amara akụkọ a nke ọma. Ọ bụ ihe kpalitere nde kwa nde ebe ụmụ ntakịrị n'anọ echere nne ha na nna ha, ngosi oge a mụrụ Jizọs ka Ọ nọ n'ime ihe eji enye anụmanụ nri, na ihe ejije ọmụmụ Jizọs n'ụlọ ụka gasị. N'agbanyeghi ụzọ niile anyị siri bugoo ọmụmụ Jizọs ná nye ya ọkwa elu, ọ bụ ọmụmụ dị ala. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ a wụrụ na ala isi bịa n'ụwa. Mana nke ahụ bụkwa isi ihe niile. Ọkpara Chineke weturù Onwe Ya oké ala ka O wee bulie anyị niile elu.

Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịrịba ama ka Luk si hazie ihe a merenụ n'oziọma. Dị ka ọ ga-eme ọbụna karịa na Luk 3, Luk ji nlezianya rịba ama onye bụ onye nọ n'ọchịchị ndị Rom n'oge ahụ. Siza Ọgọstọs bụ onye kpọrọ onwe ya “Dominus et Deus” ma ọ bụ “Onyenwe na Chineke” nke ala ahụ niile ọ n'achi n'elu ya. Mgbe Siza nyere iwu si, "Ụnụ wụpụ!" Ụwa dum aza ya si, "Ruo ogo ole ka ị chọrọ ka anyị wùruó?" Siza, Kwirinius, Herọd, Pọntiọs Paịlet: Ndị a bụ ndị dị ike, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ama ama nke oge ahụ.

Mana Luk deturù aha ha maka ihe kariri ihe mere eme. Ọ nọ n'arụtụ aka maka ihe dị mkpa nye ọmụmụ ihe Chineke. Ndị isi ụwa niile ahụ nwere ike n'eme ihe, na-achị ma n'ejeghari ka ha nwere ike, mana ọ dịghị otu n'ime ha pụrụ ịdị ka ma ọ bụ yie Jizọs. Siza ga-emecha bụrụ onye e chefurù n'ebe ikpofù ahịhịa nke akụkọ ihe mere eme. Mana nwa ahụ a mụrụ na Betlehem ga-emecha pụta bụrụ eze ndị eze na dị nwe ndị nwenụ bụ ezi ya na nke ga-adịgide adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ekele diri Chineke!


Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Why Jesus Was Born

Gịnị mere e jiri mụọ Jizọs? Nke a nwere ike ịdị ka ajụjụ dị mfe, nke a maarà nke ọma ịtụgharị uche na ya. Mana ka ị na-akwado maka Ekeresimesi afọ a, wepụta oge iji tụgharịa uche na mpụta miri emi na ebumnobi nke ọmụmụ Jizọs nye ndụ gị, na nye ụwa dum. Ihe ọgụgụ nke ụbọchị ise a bụ̀ Scott Hoezee dere ya, ma bụrụ nke esi na ihe òfùfè kwa ụbọchị ana akpọ Words of Hope wepụta.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Words of Hope maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://woh.org/youversion