Rut, Akụkọ Nke MgbapụtaIhe Atụ
Ngwụgwụ Chineke
Isi nke anọ meghere ebe Boaz nọ n’ọnụ ụzọ ámá, n’etiti obodo. Ọ nọ ebe a n’ihi na ọ chọro ịlụ Rut ma na-achọ onye mgbapụta nke ndị ịkwu ya. Onye ikwu kacha Rut na Naomi nso bụ nwoke anyị na-amaghị, n’agbanyeghị nke a anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe gbasara àgwà ya naanị site n’akụkụ a dị mkpirimkpi.
Anyị maara na nwoke a kwesịrị ilekọta ụmụ nwanyị abụọ a, ma ọ dịghị otu ugboro ka ọ biliri inyere ha aka ọbụla. Karia nke ahụ, mgbe Boaz jụrụ nwoke ahụ ma ọ̀ ga-achọ ịgbapụta Rut, ọ jụrụ ime otú ahụ. Nke a bụ nwoke na-enweghị àgwà nke iguzosi ike n'ezi ihe, karịsịa ma e jiri ya tụnyere Boaz.
Boaz mere ka ya na onye ikwu a zọọ ihe n’iwu ka ọ nweta ikike ịgbapụta Rut ka ọ wee lụọ ya. Ọ nweghị ọrụ iwu nyere ya imere Rut ihe ọ bụla, ma ọ dịghị ihe o mere ma ọ́ bụghị ilekọta Rut n’akwụkwọ akụkọ a dum. Boaz enyela amara dị ka Jizọs si nye anyị amara.
Amara Chineke zuuru anyị. A gbapụtala anyị site na Jizọs Kraịst, ndị mba ọzọ na-erughịị ihe ọ bụla ma e nyere anyị ikike nke onye nketa. Ugbu a otu Jizọs si gbapụta nwunye ya (Ndi Ụka), ka Boaz si gbapụta nwunye ya (Rut). Ọ lụrụ ya ọ wee tụrụ ime.
N'ụzọ na-akpali mmasị, Rut atubeghị ime n'alụmdi na nwunye mbụ ya ruo afọ iri. Anyị nwere ike iche na ọ bụbu nwaanyị aga n'oge a, ma Chineke meghere afọ ya n'oge a ka ọ wee mụọ nwa. Ọ muru otu nwa okorobịa aha ya bụ Obed, bụ́ onye ghọrọ nna ochie nke Eze Ukwu bụ Devid.
Achọrọ m ịse otu foto ọzọ nke amara na ọchịchị Chineke site na ọmụmụ nwa a. Rut bụ onye Moab; onye mba ọzọ nke na-enweghị ikike ka ekenye ya ihe ọbụla. Otú ọ dị, site na amara na mgbapụta ọ sotere n'usoro akụkọ ọmụmụ nke Kraịst. Lee ka akụkọ a si dị ịtụnanya!
Ọ dịrịghị Rut mfe. Ọ tolitere na mba ọjọọ. Di ya nwụnahụrụ ya. Ọ sooro Naomi gaa n'mba ozo wee biri n'ụkpa. Ọnọdụ niile a siri ike ma ekwuwe ha nke obere.
Agbanyeghị, dịka m rupụtara aka na mmalite nke usoro a, anyị nwere ike ịhụ akara mkpisiaka nke Chineke n'akụkọ Rut niile nakwa obi abụọ adịghị ya na Ọ nọ n'ọrụ oge niile. Ọ bụ njem dị ogologo na nke siri ike, mana ọ kwụsịrị na mgbapụta. Rut bidoro na ntọgbọ chakoo, mana ọ jedebere na nju afọ!
N'agbanyeghị otu oge gị nwere ike ịdi, cheta na Chineke na-arụ ọrụ na ndụ gị. Ọ na-akpa ákwà ntapu mara mma; emechabeghị ya, mana mkpakpa ya na-aga n'ihu. Mara na Chineke na-eme amara, dị mma, nakwa na Ọ hụrụ gị n’anya. Ọ bụrụ n’ịhụtara onwe gị ka onye nkụda mmụọ ji na njem a, leba anya ọzọ na ndụ Rut ma cheta na Chineke na-arụ ọrụ maka ọdịmma ndị nke Ya.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!
More
Anyi ga-achọ ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: brittanyrust.com