Rut, Akụkọ Nke MgbapụtaIhe Atụ

Ịlaghachiri Njupụta
Ọ bụ ihe mgbamume nke ukwuu ịmara na Chineke nọnyeere anyị, Ọ nọ n'akuku anyị, Ọ hụkwara anyị n'anya. N'ime ihe niile, n'agbanyeghị otú ndụ anyị nwere ike isi na-ewute anyị ma ọ bụ na-akụda mmụọ anyị, eziokwu ahụ ka dị na ọ dịghị ihe ọbụla pụrụ ikewapụ anyị n'ịhụnanya Chineke.
Akụkọ ole na ole na-akọwa nke a karịa nke Naomi na Rut. Taa anyị na-ahụ ha abụọ ndị di ha nwụrụ; ụmụ nwanyị abụọ na-eru uju maka ọnwụ nke ndị nwoke ha hụrụ n'anya, nọ naanị ha na mba ọjọọ. Agbanyeghị, ihe na-aga ịgbanwe na ndụ ha. Otu ụbọchị Naomi nụrụ na ihu ọma Chineke alaghachila na Betlehem nakwa na e nwere nri ọzọ n’ “ụlọ achịcha”. Obere nta ka ọ buru ozugbo ozugbo, Naomi kpebiri ịlaghachi n’ụlọ ya na ndị obodo ya.
Na mbụ, ma Ọpa ma Rut kpebiri iso Naomi gawa Betlehem. N'oge na-adịbeghị anya n'ime njem ahụ, ọ dị ka Naomi gbanwere obi ya banyere ndi so ya. Site n'nkwanye nke Naomi, Ọpa laghachiri Moab. Rut mere nhọrọ dị iche. Rut mere mkpebi iso Chineke ma anyị ahụkwara ezi mgbanwe n’ụzọ Betlehem.
Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ gara n’ihu ruo mgbe ha rutere Betlehem. Mgbe ha rutere, akwụkwọ nsọ kwuru na obodo ahụ dum mere mkpọtụ. Ọ pụtara na ama Naomi na ezinụlọ ya nke ọma n’ebe ahụ. Mgbe ọ lọtara si n'ebe ọ gawara, ndị inyom obodo ahụ niile nọ n'eme mkpọtụ n'ihi nlọghachi Naomi.
Mgbe a gbara Naomi ajụjụ maka onye ọ bụ, ọ gwara ụmụ nwaanyị obodo ahụ ka ha ghara ịkpọ ya Naomi (ihe mara mma), kama ka ha kpọọ ya Mara (ilu). Ò nwetụla mgbe inwere mmetuta dị ka Naomi, Ị juburu eju mana ugbu a I tọgbọrọ chakoo? Ọ bụ n'oge ahụ mgbe a napụrụ ihe anyị hụrụ n'anya ka anyị na-enwe mmetụta nke adịghị ike na iwe. Iwe iwe abụghị ihe ọjọọ; naanị anyị kwesịrị ijide n'aka bụ ka iwe anyị ghara itụgharị buru obi ilu.
Aga M ekwuriri nke a, ọ masịrị m ihe Naomi mere n'ime akụkọ a. Ọ lọghachiteghi n'eme dika ọ nweghị ihe mere; ọ laghachikwutere ndi-ya ma kwukwaa ezi-okwu. Ka anyị niile dị njikere ịgwa ndị gbara anyị gburugburu eziokwu maka mgba anyị na-agba nakwa nakwere mgbe anyị chọrọ agbamume. Inwe obodo nke ndị kwere ekwe gbara gị gburugburu n'oge ihe isi ike gị bụ isi ihe n'usoro ọgwụgwọ gi.
Rut na Naomi laghachiri n’ụlọ achịcha ná mmalite owuwe ihe ubi ọka bali. Ọ bụ ihe ana akpaghi akpa mere? Echeghi m otu ahu. Ike a na-adịghị ahụ anya na-aga n'ihu ma ụmụ nwanyị abụọ a ga-ahụ ka Chineke ga-eme nnukwu ihe dị ebube nke a na-adịghị ahụ anya n'oge a.
Agbamume m na-enye gị taa bụ ka ị tụkwasị obi na Chineke nọ n'ọrụ. Mara na atụmatụ Ya na-aga n’ihu na ị nọ n’ihu Ya. Ọ chefubeghị banyere gị, ọ dịghịkwa ihe nwere ike ime ka Ọ kwụsị ịhụ gị n'anya. Ọ bụrụ na ị na-enwe mgba n'uzo ọbula ma ọ bụ na-eche na ị nọ naanị gị, atụla egwu ịgakwuru ndị na-asọpụrụ Chineke ndi gbara gị gburugburu.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!
More
Anyi ga-achọ ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: brittanyrust.com