Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Rut, Akụkọ Nke MgbapụtaIhe Atụ

Ruth, A Story Of Redemption

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

N'Ebe Ala Nke Nzọcha Mkpụrụ

Rut na Boaz bụ ndị di ka mụ na gi a na-egosipụta n’ihi okwukwe na nrubeisi ha. Obi abụọ adịghị ya, na Rut bụ nwanyị nwere okwukwe. Ọ nwere ezi mgbanwe n'ụzọ Betlehem wee gaa n'ihu njem ya ruo ala ọhụrụ ahụ. Ọ kweere na Chineke ga-enye ya na Naomi nri ka ọ gawara ịtụtụkọta ihe. Ọ kweere ma tụkwasị obi n'etiti ihe isi ike.

Ọ bụrụ na e nwere otu ihe anyị nwere ike ijide n'aka ọ bụ na n'agbanyeghị otú oge anyị nwere ike isi sie ike, anyị ga-ekwere ma tụkwasị obi na Chineke na-egboro anyi mkpa anyi. N'agbanyeghị na oge ụfọdụ siri ike, anyị ga-ekwe ka okwukwe anyị gbatia ruo n'ebe ịtụkwasị Chineke obi, emeghi nke a ga-eme ka okwukwe anyị ghara ito eto iji hụ njupụta nke ihe Chineke chọrọ ime na ndụ anyị.

Rut bụ nwaanyị na-eme omume ọma, otú ahụkwa ka ọ dịkwa nwoke ọ makwasịrị n'ụkwụ ya. Nkwekọ nke Boaz na Rut bụ ezigbo nkwekọ n'ụzọ ahụ. Mmadụ abụọ nwere nnukwu omume ọma e kpọkọtara ọnụ site na ntụzịaka na ịdị mma nke Chineke. Ekwenyere m na enwere ọtụtụ ihe a ga-ekwu site na akụkọ a.

Ka Rut na-eje ije n’obiọma, okwukwe na ịdị umeala n’obi, nwoke ahụ ọ hụrụ n’anya jara ya mma. Boaz hụrụ ịdị mma na omume ọma ya ma kwanyere ya ùgwù maka ya site n'ịza ekpere nke okpere n'isi nke abụọ maka ya. Ma karịa nke ahụ, Chineke hụrụ ịdị mma na omume ọma ya.

Anụla m okwu a, "agwa bụ onye ị bụ mgbe ọ na-adịghị onye na-ekiri gi." N'ezie Rut amaghị na a ga-eme ka ndụ ya pụta ìhè ruo n'ókè dị otú ahụ, ma ọtụtụ nde mmadụ na-ele ya anya dị ka ihe atụ. Cheedị echiche ihe Chineke chọrọ ime site na ndị Ya nwere oke agwa. Ọ bụ n'oge anyị chere na ọ nweghị onye na-ekiri anyị ma ọ bụ enweghị ụgwọ ọrụ maka omume anyị ka Chineke na-ahụ àgwà anyị.

Ka mụ na gị bụrụ ndị a pụrụ ịkpọ ndị ikom na ndị inyom nwere omume ọma dị ka Rut na Boaz. Na-arụ ọrụ n'okwukwe mgbe ọ di ka olileanya adighị. Were obi umeala zaghachi ohere ndị enyere gị. Nyekwa ndị niile nọ gburugburu gị ebere ịhụnanya. Ọ nwere ike ị maghị onye udi ndụ i na-ebi na-emetụ.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ruth, A Story Of Redemption

Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!

More

Anyi ga-achọ ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: brittanyrust.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara