Rut, Akụkọ Nke MgbapụtaIhe Atụ
Ebe Dị Anya N'Ụlọ
Ị nwetụla mgbe ị na-eche ma Chineke Ọ na-arụ ọrụ na ndụ gị? Echeela m otu a ọtụtụ oge, ma mechaa cheta maka akwụkwọ nke Rut. Anyị anaghị ahụ ọrụ ebube ma ọ bụ ntinye aka dị nsọ site n’Eluigwe; anyị na-ahụ ka Chineke ji ụzọ ana adighị ahụ anya na-arụ ọrụ ka Ọ na-edu ụmụ nwanyị abụọ ahụ n'ụzọ nke mweghachi na ịmị mkpụrụ.
Akwụkwọ nke Rut ji akụkọ banyere otu ezinụlọ bi na Betlehem malite. Ha bi n’obodo a maara dị ka ụlọ achịcha, ma owu nri dị. Onye dere akwụkwọ ahụ agwaghị anyị ọtụtụ ihe banyere ọnọdụ ezinụlọ a; anyi bidoro obere ozugbo ka ha kwakoro gawa n'ala Moab. Site ná mmalite, mba Moab bụ ndi n'eme omume rụrụ arụ. N'agbanyeghị nke ahụ, Elimelek mere mkpebi ịkpọpụ ezinụlọ ya n'ụlọ achịcha iji gaa mba ọzọ nke mmehie jupụtara.
Anyị agaghi ebe dị anya n'isi nke mbụ tupu anyị achọta ihe dị mkpa anyi kwesiri ime n'ime ndụ anyị. Mgbe anyị n'agabiga oge ihe isi ike, anyị ekwesịghị ịdabere ná nghọta nke mmadụ ma ọ bụ were ụzọ mgbapụ dị mfe; anyị kwesiriri ịchọ Chineke maka nzube Ya. Elimelek ajụghị Chineke ihe bụ uche Ya, ọ tụkwasịghịkwa Chineke obi. Kama, ọ gwupụrụ ezinụlọ ya n’ebe ndị Chineke bi ka ha gaa biri n’ala ọjọọ ebe a na-agaghi enwe ebe a ga-efe Chineke ma ha na ndị kwere ekwe ndị ọzọ agaghi enwe mmekọrịta.
N'ụzọ na-eju anya, Elimelek gbapụrụ ka ọ gbanari onwụ, ma nke ahu bụ nke biakwụtere ya na ụmụ ya n'ime afọ iri. Ọ bụghị nanị na mkpebi ọjọọ ọ mere kpara ya aka ọjọọ, kamakwa ọ metụtara ezinụlọ ya dum. Anyị kwesiri ịghọta na nhọrọ ndị anyị na-eme ná ndụ ga-emetụta ndị ọzọ.
Ozugbo Elimelek gbapụrụ n'ogige nke ime uche Chineke, ọ nweghịzi ike ịmata ọdịiche dị n'etiti ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ọ kwere ka ụmụ ya ndị ikom lụọ ndị inyom Moab bụ́ ndị na-amaghị Chineke ma kwebara alụmdi na nwunye na-ekwekọghị ekwekọ. Jiri otu mkpebi ọjọọ, Elimelek duuru ezinụlọ ya pụọ n'ihe nke Chineke. Ọ dị mkpa ka mụ na gị na-achọ uche Chineke kama ime ihe anyị chere kachasị mma. Otu mkpebi na-adịghị mma nwere ike iduba anyị n'ọtụtụ mkpebi na-adịghị mma.
Ozi ọma di bụ, Chineke na-eweghachi nakwa Chineke dị mma. Anyị anaghị ahụ ka naanị otu mkpebi siri wee bibie ezinụlọ. Chineke aruchabeghị ọrụ.
Dịka ndị nke Chineke anyị nwere ohere pụrụ iche ịmara uche Ya na ibi n’okpuru nche nzere mmiri Ya. Ọ nwere oge na ndụ anyị mgbe oké ifufe na-efe. Ọ bụ n'oge ndị ahụ ka anyị nwere ike ịchọ uche Ya ma tụkwasị Ya obi, ma ọ bụ anyị nwere ike ịdabere na nghọta nke anyị ma mee mkpebi anyị chere kachasị mma. N'ikpeazụ, atụmatụ Chineke maka anyị dị mma karịa nke anyị.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!
More
Anyi ga-achọ ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: brittanyrust.com