Rut, Akụkọ Nke MgbapụtaIhe Atụ
Ikwupụta N'Ezi
Taa anyị na-amalite ịhụ ntụzịaka na atụmatụ Chineke na-arụ ọrụ ka Rut na-amalite ndụ ọhụrụ ya na Betlehem. Ị nwere ike iche echiche otú osi wee diri ya? Ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nke si mba ọzọ a na-akwanyeghiri ùgwù. Ọ bụ onye kwere ekwe ọhụrụ. Ihe niile dị ya ọhụrụ nakwa ọ dịghị nke ọ ma. Eji m n’aka na ọ ka nọ na-enwe mwute n’ihi ọnwụ di ya. Ma n’agbanyeghị ihe niile a ma nke na-emetụta ya n’obi, ọ jisiri obi ike nke ọ nwere n’ebe Chineke nọ.
Ná mmalite isi nke abụọ, Rut jiiri nzu gaa n’ebe a na-ako nri wee na-atụtụkọta ihe ndi ohuru iji wee dọba nri na tebụl. Dị ka iwu Levitikọs (Levitikọs 19) si kwuo, e nyere ndị na-ewe ihe ubi iwu ka ha ghara ịtụtụkọta ihe ubi dum, kama ka ha hapụru ndị ogbenye akuku ubi ha. Ọ bụghị nanị na Rut pụtara ịrụ ọrụ siri ike nke ịchịkọta ihe ndi gbachara ibe ibe na mpe mpe, kama ọ bụ ihe na-eweda mmadu ala.
Boaz wee bata, Onye-mgbaputa! Boaz nọchiri anya Jizọs Kraịst n'ime akwụkwọ a niile, Onye Mgbapụta anyị. Foto mara mma nke Jizọs na-amakuba onye mmehie n'ime aka nke ịhụnanya Ya. Ya mere, ònye bụ nwoke a aha ya bụ Boaz? Anyị ma na ọ bụ onye ezinụlọ Naomi site na alum di na nwunye. Anyị maara na ọ bụ nwoke katuru nka nke toro eto na akụ na ụba n'ime obodo. Aha ya pụtara "ike" n'ezie. Anyị maara na ọ na-emeso ndị ọrụ ya na ndị ọ na-amabughị nke ọma. Nke kacha mkpa bụ na, anyị ma na ọ bụ nwoke ma Chineke.
Mgbe Boaz hụchara Rut n’ubi ya ma jụọ ese banyere ya, ọ gwara ya ka ọ nọrọ n’ubi ya, na ọ ga-ahuriri na elekọtara ya. N'okwu obiọma dị otú ahụ, Rut dara n'ala jụọ Boaz ihe mere ọ ji meere ya obiọma dị otú ahụ. Cheta, na Rut bụ onye Moab, ma ihe Boaz meere ya gafere ihapụru ya ibe ibe na mpe mpe nri.
N'ajụjụ ọnụ ya banyere obiọma ọ meere ya, Boaz kwuru okwu mara mma. Ọ bụghị nanị na Boaz kwuru maka ịma mma nke di n'ime Rut nakwa àgwà ya, ọ kwukwara ngọzi n'isi ya.
Chineke chọrọ iwere anyị niile - ndị mba ọzọ, ndị ogbenye, ndị owu na-ama, ndị ndụ ha tiwasiri etiwasi, ndị obi ilu, anyị niile - n'okpuru nku Ya. Chineke chọrọ ichebe na ikpụchi GỊ. Iji wetara gị nkasi obi na ọñụ. Ọchịchọ Boaz nwere maka Rut bụ ihe atụ nke ọchịchọ Chineke maka anyị. Ka anyị nile nweta izu ike na ebe obibi n’okpuru nku Ya. Chineke chọrọ ichebe gị ma kwee ka ị too n'ụdị mmadu Ọ kere gị ka ị bụrụ.
Mgbe Rut lọtakwuru Naomi, ọ bu nri kariri ihe ọ chere. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na Rut ji nri ga-ezuru ha otu afọ pụọ! Enyi, taa ị nwere ike na-achọ ibe ibe nke olileanya ma ọ bụ nke ọgwụgwọ, mana Chineke chọrọ inye gị karia ka Ị na-achọ! Na-atụ anya na Chineke ga-enye gị ihe karịrị ma gabiga oke ihe ị nwere olileanya ya ma ọ bụ n'eche n'echiche!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụ mmadụ ole na ole n'ime Akwụkwọ Nsọ ka anyị na-enwe mmetụta banyere ha karịa Rut; onye ogbenye, onye mba ọzọ di ya nwụrụ nke mere ka Chineke bụrụ ihe na Onye kachasị ya mkpa ma lee anya ka Ọ si gbanwee ndụ ya. Ọ bụrụ na ị na-achọ agbamume n'ọnọdụ gị, atọla atụmatụ ọgụgụ a n'ala!
More
Anyi ga-achọ ikele Brittany Rust maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: brittanyrust.com